-
Matiu 13:54-58Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
54 Mgbe ọ banyere n’obodo ya,+ ọ malitere izi ha ihe n’ụlọ nzukọ ha, nke mere na o juru ha anya, ha asị: “Olee ebe nwoke a si nweta amamihe a? Ònye nyekwara ya ike o ji arụ ọrụ ebube ndị a?+ 55 Onye a ọ́ bụghị nwa ọkwá nkà?+ Ọ́ bụghị nne ya ka a na-akpọ Meri? Ọ̀ bụkwa na ụmụnne ya ndị nwoke abụghị Jems na Josef na Saịmọn na Judas?+ 56 Ọ̀ bụ na anyị na ụmụnne ya ndị nwaanyị niile anọghị? Oleezi ebe o si nweta ihe ndị a niile?”+ 57 N’ihi ya, ha anabataghị ya.+ Ma Jizọs sịrị ha: “A na-asọpụrụ onye amụma ma e wezụga n’obodo ya nakwa n’ụlọ ya.”+ 58 Ọ rụghịkwa ọtụtụ ọrụ ebube ebe ahụ n’ihi na ha enweghị okwukwe.
-