-
Matiu 21:1-3Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
21 Mgbe ha ruru Jeruselem nso, ha kwụsịrị na Betfeji, n’Ugwu Oliv. Jizọs wee zipụ mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya,+ 2 sị ha: “Gaanụ n’obodo a unu na-ahụ. Ozugbo unu banyere n’ime ya, unu ga-ahụ jakị e liwere eliwe na nwa jakị ya na ya nọ. Tọpụnụ ha, kpụtara m ha. 3 Ọ bụrụ na onye ọ bụla agwa unu ihe ọ bụla, sịnụ ya, ‘Onyenwe anyị chọrọ ka anyị kpụta ha.’ Ọ ga-ahapụkwa ha ka unu kpụrụ ha.”
-
-
Luk 19:29-34Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
29 Mgbe o ruru Betfeji na Betani nso n’ugwu a na-akpọ Ugwu Oliv,+ ọ gwara mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya,+ sị: 30 “Gaanụ n’obodo a unu na-ahụ. Mgbe unu banyere n’ime ya, unu ga-ahụ nwa jakị e liwere eliwe, nke mmadụ ọ bụla na-anọtụbeghị n’elu ya. Tọpụnụ ya, kpụtakwanụ ya ebe a. 31 Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụọ unu, sị, ‘Gịnị mere unu ji na-atọpụ ya?’ sịnụ ya, ‘Onyenwe anyị chọrọ ka anyị kpụta ya.’” 32 Mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ ya gara hụ ya otú ahụ ọ gwara ha.+ 33 Ma ka ha nọ na-atọpụ nwa jakị ahụ, ndị nwe ya sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-atọpụ nwa jakị ahụ?” 34 Ha asị: “Onyenwe anyị chọrọ ka anyị kpụta ya.”
-