-
Matiu 26:17-19Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 N’ụbọchị mbụ nke Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko,+ ndị na-eso ụzọ Jizọs bịakwutere ya, sị ya: “Olee ebe ị chọrọ ka anyị kwadebere gị ka ị nọrọ rie nri Ememme Ngabiga?”+ 18 O wee sị ha: “Banyenụ n’ime obodo, n’ụlọ onye dị otú a. Sịnụ ya, ‘Onye Ozizi sịrị: “Oge m a kara aka dị nso. Mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-eme Ememme Ngabiga n’ụlọ gị.”’” 19 Ndị na-eso ụzọ Jizọs mere ihe ọ gwara ha, kwadebekwa maka Ememme Ngabiga ahụ.
-