27Mgbe o ruru n’ụtụtụ, ndị isi nchụàjà na ndị okenye niile nke ndị Juu gbara izu ka e gbuo Jizọs.+2 Mgbe ha kechara ya agbụ, ha kpụụrụ ya pụọ, nyefee ya n’aka Paịlet, bụ́ gọvanọ.+
28 Ha wee kpụrụ Jizọs si n’ụlọ Kayafas gaa n’ụlọ gọvanọ.+ Ọ bụzi isi ụtụtụ. Ma, ha abanyeghị n’ụlọ gọvanọ ka ha ghara imerụ onwe ha,+ ka ha nwee ike iri nri Ememme Ngabiga.
13 Chineke Ebreham na nke Aịzik na nke Jekọb,+ ya bụ, Chineke nna nna anyị hà, emeela ka Jizọs,+ bụ́ Ohu ya, dị ebube,+ onye unu nyefere+ Paịlet, gọnahụkwa ya n’ihu ya, mgbe ọ chọrọ ịhapụ ya.