21 mgbe ahụ m ka na-ekpe ekpere a, otu onye bịakwutere m. Ọ bụ Gebriel,+ onye ahụ m hụburu n’ọhụụ.+ Ọ bịakwutere m mgbe ike gwụcharala m, n’ihe dị ka n’oge e ji achụ àjà ná mgbede.
26 Mgbe ime ya ruru ọnwa isii, Chineke zipụrụ mmụọ ozi Gebriel+ ka ọ gaa Nazaret nke dị na Galili, 27 gakwuru nwa agbọghọ na-amaghị nwoke+ nke otu nwoke aha ya bụ Josef kwere nkwa ịlụ. Nwoke a si n’ezinụlọ Devid. Aha nwa agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke bụ Meri.+