Matiu 16:16 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 16 Saịmọn Pita zara, sị: “Ị bụ Kraịst,+ Ọkpara Chineke dị ndụ.”+ Mak 8:29 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 29 O wee jụọ ha, sị: “Ma ònye ka ununwa chere na m bụ?” Pita zara ya, sị: “Ị bụ Kraịst.”+ Jọn 1:41 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 41 Ihe mbụ o mere bụ ịchọta nwanne ya, bụ́ Saịmọn, sị ya: “Anyị ahụla Mezaya+ ahụ” (nke pụtara “Kraịst”). Jọn 6:68, 69 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 68 Saịmọn Pita zara ya, sị: “Onyenwe anyị, ònye ka anyị ga-alakwuru?+ Okwu gị na-enye ndụ ebighị ebi.+ 69 Anyị ekwerela, marakwa na ị bụ Onye Nsọ nke Chineke.”+
41 Ihe mbụ o mere bụ ịchọta nwanne ya, bụ́ Saịmọn, sị ya: “Anyị ahụla Mezaya+ ahụ” (nke pụtara “Kraịst”).
68 Saịmọn Pita zara ya, sị: “Onyenwe anyị, ònye ka anyị ga-alakwuru?+ Okwu gị na-enye ndụ ebighị ebi.+ 69 Anyị ekwerela, marakwa na ị bụ Onye Nsọ nke Chineke.”+