Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Matiu 12:24-30
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 24 Mgbe ndị Farisii nụrụ ihe a, ha sịrị: “Ọ bụ ike Bielzebọb,* onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ, ka onye a ji achụpụ ndị mmụọ ọjọọ.”+ 25 Ebe ọ ma ihe ha na-eche n’echiche, ọ sịrị ha: “Alaeze ọ bụla nke kewara wee na-emegide onwe ya ga-ada. Obodo ọ bụla ma ọ bụ ezinụlọ ọ bụla nke kewara wee na-emegide onwe ya agaghị adịgide. 26 Ọ bụrụkwa na Setan achụpụ Setan, o kewaala na-emegide onwe ya. Oleezi otú alaeze ya ga-esi kwụrụ? 27 Ọ bụrụkwa na m ji ike Bielzebọb na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, ọ̀ bụ ike onye ka ụmụ unu ji na-achụpụ ha? Ọ bụ ya mere ha ga-eji bụrụ ndị ga-ekpe unu ikpe. 28 Ma ọ bụrụ na ọ bụ mmụọ Chineke ka m ji na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, n’eziokwu, Alaeze Chineke akwaala unu.+ 29 Ma ọ bụ, olee otú mmadụ ọ bụla ga-esi banye n’ụlọ nwoke dị ike ma buru ngwongwo ya, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ kee nwoke ahụ dị ike agbụ? Ọ bụ naanị mgbe ahụ ka ọ ga-enwe ike ibukọrọ ihe ndị dị n’ụlọ ya. 30 Onye na-anọghị n’akụkụ m na-emegide m. Onye na-esoghịkwa m na-ekpokọta ekpokọta na-ekposa ekposa.+

  • Mak 3:22-27
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 22 Ndị odeakwụkwọ ndị si Jeruselem bịa nọkwa na-asị: “Bielzebọb* nọ n’ime ya, o jikwa ike onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ achụpụ ndị mmụọ ọjọọ.”+ 23 N’ihi ya, ọ kpọrọ ha ka ha bịakwute ya, ya emeere ha ihe atụ, sị: “Olee otú Setan ga-esi achụpụ Setan? 24 Ọ bụrụ na alaeze ekewaa na-emegide onwe ya, alaeze ahụ ga-ada.+ 25 Ọ bụrụ na ezinụlọ ekewaa na-emegide onwe ya, ezinụlọ ahụ ga-ada. 26 Ọ bụrụkwa na Setan ebilie na-emegide onwe ya ma kewaa, ọ gaghị eguzo, kama nke ya agwụla. 27 N’eziokwu, e nweghị onye banyere n’ụlọ nwoke dị ike nke ga-enwe ike izuru ihe ya ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ kee nwoke ahụ dị ike agbụ. Ọ bụ naanị mgbe ahụ ka ọ ga-enwe ike izuru ihe ndị dị n’ụlọ ya.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya