16 M ga-achọ nke furu efu,+ dughachite nke kpafuru akpafu, kee ọkpụkpụ nke gbajiri agbaji ákwà, meekwa ka nke ike na-adịghị dị ike. Ma, m ga-ala nke buru ibu na nke dị ike n’iyi. M ga-ekpe ha ikpe, taakwa ha ahụhụ kwesịịrị ha.”
4 “Ònye n’ime unu nke nwere otu narị (100) atụrụ, ka ọ ga-abụ, otu n’ime ha fuo, ya aghara ịhapụ iri itoolu na itoolu n’ala ịkpa gaa chọwa nke ahụ furu efu ruo mgbe ọ chọtara ya?+
15 Kraịst Jizọs bịara n’ụwa a ka ọ zọpụta ndị mmehie.+ Ihe a m na-ekwu bụ eziokwu, anyị kwesịkwara iji obi anyị niile nabata ya. N’ime ndị mmehie a niile, ọ bụ m kacha bụrụ onye mmehie.+