5 Jizọs zipụrụ mmadụ iri na abụọ a ma sị ha:+ “Unu abanyela n’okporo ụzọ ndị mba ọzọ, unu abanyekwala n’obodo ndị Sameria.+6 Kama, na-agakwurunụ atụrụ furu efu bụ́ mba Izrel.+
46 Pọl na Banabas wee gwa ha n’atụghị egwu, sị: “Ọ dị mma na unu bụ ndị mbụ a gwara okwu Chineke.+ Ma, ebe ọ bụ na unu jụrụ ya, meekwa onwe unu ndị na-erughị eru inweta ndụ ebighị ebi, anyị na-agakwuru ndị mba ọzọ.+
8 N’ihi na ana m agwa unu na Kraịst ghọrọ onye na-ejere ndị e biri úgwù ozi+ iji gosi na Chineke na-ekwu eziokwu, ka o wee gosi na nkwa niile Chineke kwere ndị nna nna ha bụ eziokwu+