-
Ndị Filipaị 2:9-11Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 Ọ bụ ya mere Chineke ji bugoo ya n’ọkwá ka elu,+ jirikwa obiọma nye ya aha karịrị aha ọ bụla ọzọ,+ 10 ka ikpere niile wee gbuo n’ala n’aha Jizọs, ma nke ndị nọ n’eluigwe ma nke ndị nọ n’ụwa ma nke ndị nọ n’ime ala,*+ 11 ka ire ọ bụla wee kwupụtakwa na Jizọs Kraịst bụ Onyenwe anyị,+ ka e wee nye Chineke Nna otuto.
-