17 Ebe ọ bụ na ọnwụ si n’aka otu onye bụrụ eze n’ihi mmehie onye ahụ,+ o doro anya na ndị na-enweta amara Chineke n’ụba na onyinye ezi omume ahụ e nyere n’efu+ ga-adị ndụ ma si n’aka otu onye ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst,+ bụrụ ndị eze.+
5 E nwere otu Chineke,+ nweekwa otu onye ogbugbo+ n’etiti Chineke na mmadụ,+ ya bụ, Kraịst Jizọs.+6 O ji ndụ ya chụọ àjà, si otú ahụ nye ihe dabara adaba a ga-eji agbapụta mmadụ niile.*+ Ndị mmadụ ga-ekwukwa gbasara ihe a mgbe oge ya ruru.