16 “N’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya,+ ka a ghara ibibi onye ọ bụla nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.+
17 Ndị nwere okwukwe na-esi n’ozi ọma ahụ amata ezi omume Chineke, ọ na-emekwa ka ha na-enwekwu okwukwe+ otú e dere ya, sị: “Ma onye ezi omume ga-adị ndụ maka na o nwere okwukwe.”+