-
Luk 24:39-41Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
39 Ọ bụ m. Leenụ aka m na ụkwụ m. Metụnụ m aka ka unu chọpụta, n’ihi na mmụọ anaghị enwe anụ ahụ́ na ọkpụkpụ dị ka unu na-ahụ na m nwere.” 40 Mgbe o kwuru ihe a, o gosiri ha aka ya na ụkwụ ya. 41 Ma ha ekwetaghị n’ihi ọṅụ juru ha obi na otú ihe a si ju ha anya. Ọ sịziri ha: “Ùnu nwere ihe oriri ebe a?”
-
-
Jọn 20:19, 20Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
19 Mgbe chi jiwere n’ụbọchị ahụ, bụ́ ụbọchị mbụ n’izu, ndị na-eso ụzọ Jizọs zukọtara n’otu ụlọ ma kpọchie ọnụ ụzọ ya akpọchie n’ihi na ha na-atụ ndị Juu egwu. Ma, Jizọs bịara guzoro n’etiti ha, sị ha: “Udo dịrị unu.”+ 20 Mgbe o kwuchara ihe a, o gosiri ha aka ya na akụkụ ya.+ Ndị na-eso ụzọ ya wee ṅụrịa ọṅụ na ha hụrụ Onyenwe anyị.+
-