-
Ọnụ Ọgụgụ 21:8, 9Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
8 Jehova gwaziri Mosis, sị: “Kpụọ agwọ yiri agwọ ọjọọ ma konye ya n’elu osisi. Ọ bụrụ na agwọ ataa onye ọ bụla, onye ahụ ga-ele ya anya ka ọ ghara ịnwụ.” 9 Mosis ji ọla kọpa kpụọ agwọ+ ozugbo ma konye ya n’elu osisi.+ Mgbe ọ bụla agwọ tara mmadụ, onye ahụ elee agwọ ọla kọpa ahụ anya, onye ahụ anaghị anwụ.+
-