46 Ọ sịkwara ha, “Akwụkwọ Nsọ sịrị: na Kraịst ga-ata ahụhụ ma si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị nke atọ,+47 malitekwa na Jeruselem+ ruo ná mba niile,+ a ga-eji aha ya kwusaara ndị mmadụ na ha kwesịrị ichegharị ka a gbaghara ha mmehie ha.+
31 Chineke buliri onye a elu ka ọ nọrọ n’aka nri ya.+ Ọ họpụtara ya ka ọ bụrụ Nnukwu Onye Ndú+ na Onye Nzọpụta.+ Chineke mere ihe a ka ndị Izrel chegharịa, ka a gbagharakwa ha mmehie ha.+