-
1 Jọn 2:18, 19Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
18 Ụmụntakịrị, ihe a bụ awa ikpeazụ. Unu nụrụ na onye na-emegide Kraịst na-abịa.+ E nweedịla ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst ugbu a.+ Ọ bụ ya mere anyị ji mara na ihe a bụ awa ikpeazụ. 19 Ha si n’ebe anyị nọ pụọ, ma anyị na ha abụghị otu;+ n’ihi na a sị na anyị na ha bụ otu, ha gaara eso anyị nọrọ. Ma ha pụrụ ka e wee gosi na anyị na mmadụ niile abụghị otu.+
-