38 “N’ihi ya, ụmụnna m, ya doo unu anya na ọ bụ naanị Jizọs ka Chineke na-esi n’aka ya agbaghara anyị mmehie. Ọ bụ ihe a ka a na-ekwusara unu.+ 39 Marakwanụ na Iwu Mosis emelighị ka unu bụrụ ndị ezi omume.+ Ma n’ihi ọnwụ nwoke a, Chineke ga-agụ onye ọ bụla kweere na ya n’onye ezi omume.+