16 “N’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya,+ ka a ghara ibibi onye ọ bụla nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.+
25 Chineke wepụtara ya ka ọ bụrụ àjà nke ga-eme ka ya na ụmụ mmadụ dịrị n’udo+ ma ha nwee okwukwe n’ọbara ya.*+ Chineke mere ihe a iji gosi na ya bụ onye ezi omume n’ihi na ntachi obi* ya mere ka ọ na-agbaghara mmehie ndị e mere n’oge gara aga.