17 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu bụ Chi kacha chi niile+ na Onyenwenụ kacha ndị nwenụ niile, Chineke dị ebube, onye dị ike, na onye e kwesịrị ịna-atụ egwu, onye na-anaghị ele onye ọ bụla anya n’ihu,+ ọ naghịkwa anara aka azụ.*
7 Na-atụnụ egwu Jehova.+ Kpacharanụ anya n’ihe unu na-eme, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke anyị anaghị ekpe ikpe na-ezighị ezi.+ Ọ naghị ele mmadụ anya n’ihu,+ ọ naghịkwa ana aka azụ.”*+
34 Pita wee sị: “O doola m nnọọ anya na Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu.+35 Kama ná mba ọ bụla, ọ na-anabata onye na-atụ egwu ya, nke na-emekwa ihe dị mma.+