14 Mgbe igirigi ahụ kọrọ, e nwere iberibe ihe dị mụrụmụrụ juru n’ala ịkpa ahụ.+ Ha dị mụrụmụrụ ka mkpụrụ mmiri n’ala. 15 Mgbe ndị Izrel hụrụ ya, ha malitere ịsị ibe ha, “Gịnị ka ọ bụ?” maka na ha amaghị ihe ọ bụ. Mosis sịrị ha: “Ọ bụ achịcha Jehova nyere unu ka unu na-eri.+