-
2 Ndị Kọrịnt 11:23-27Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
23 Hà bụ ndị ozi Kraịst? Ana m aza ka onye ara, abụ m karịa ha: Arụọla m ọrụ karịrị nke ha rụrụ.+ A tụọla m mkpọrọ ọtụtụ ugboro karịa ha.+ E tiela m ihe ọtụtụ ugboro, anọọkwala m n’ọnụ ọnwụ ọtụtụ ugboro.+ 24 Ndị Juu pịara m ọnụ ụtarị iri atọ na itoolu* ugboro ise.+ 25 Ndị ọzọ pịara m ụtarị ugboro atọ.+ A tụrụ m nkume otu ugboro.+ Ugboro atọ ka m nọ n’ụgbọ mmiri na-aga njem, ụgbọ ekpuo.+ M nọrọ n’ime oké osimiri otu ụbọchị, ehihie na abalị. 26 Ana m aga ọtụtụ ebe. Ka m na-aga, e nwere oge ndị m hụsiri anya ma n’osimiri, ma n’aka ndị ohi, ma n’aka ndị obodo anyị,+ ma n’aka ndị mba ọzọ,+ ma n’obodo ukwu,+ ma n’ala ịkpa, ma n’oké osimiri, ma n’aka ndị na-abụghị ezigbo ụmụnna. 27 Arụrụ m ọrụ siri ike, gbaa ezigbo mbọ,+ mụọ anya abalị ọtụtụ ugboro.+ Agụụ gụrụ m, akpịrị kpọkwara m nkụ. Anọrọ m ọtụtụ ugboro n’erighị nri,+ oyi ana-atụ m, enweghịkwa m uwe m ga-eyi.*
-