12 N’ihi ya, Iwu ahụ dị nsọ, ihe e kwuru na ya dịkwa nsọ, zie ezie ma dị mma.+
13 Ọ̀ pụtaziri na ihe dị mma kpataara m ọnwụ? Mbanụ! Kama ọ bụ mmehie kpataara m ya. Mmehie si n’ihe dị mma kpatara m ọnwụ iji mee ka a mata ihe bụ́ mmehie.+ Iwu ahụ si otú a gosi na mmehie jọgburu onwe ya.+