-
2 Ndị Tesalonaịka 1:4, 5Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
4 N’ihi ya, anyị ji unu akpa nganga+ n’ọgbakọ dị iche iche nke Chineke n’ihi otú unu si atachi obi ma nwee okwukwe n’agbanyeghị mkpagbu niile a na-akpagbu unu na ahụhụ niile unu na-ata.*+ 5 Ihe a na-egosi na Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi, nke mere e ji were unu ka ndị ruru eru inweta Alaeze Chineke, bụ́ nke unu na-atara ahụhụ.+
-