17 Ma ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ Chineke, anyị ga-eketa ihe Chineke ga-ekenye anyị. Ọ ga-ekenye anyị ihe ahụ+ Kraịst ga-eketa ma ọ bụrụhaala na anyị na Kraịst atakọọ ahụhụ,+ ka e wee mee ka anyị na ya dịkọọ ebube.+
24 Ana m aṅụrị ọṅụ ugbu a n’agbanyeghị na m na-ata ahụhụ maka unu.+ Echere m na m ga na-ata ya na-aga ebe m so n’ahụ́ Kraịst. Ahụhụ a m na-ata bụkwa maka ọdịmma nke ahụ́ Kraịst,+ ya bụ, ọgbakọ ya.+