7 Na-enyenụ mmadụ niile ihe ruuru ha: onye e kwesịrị ịtụrụ ụtụ isi, tụọrọnụ ya ụtụ isi;+ onye e kwesịrị ịtụrụ ụtụ ahịa, tụọrọnụ ya ụtụ ahịa; onye e kwesịrị ịtụ egwu, tụọnụ ya egwu;+ onye e kwesịrị ịsọpụrụ, sọpụrụnụ ya.+
22 Ndị ohu, na-eruberenụ ndị nna unu ukwu* isi+ n’ihe niile. Unu erubela isi naanị ka ndị ọzọ hụ unu, ka obi dị ndị mmadụ ụtọ, kama jirinụ obi unu niile na-erubere ha isi iji gosi na unu na-akwanyere Jehova* ùgwù.