-
Jenesis 14:17-20Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 Mgbe Ebram merichara Kedọlaoma na ndị eze ya na ha so ma lọta, eze Sọdọm gara ka o zute Ebram na Ndagwurugwu Sheve, ya bụ, Ndagwurugwu Eze.+ 18 Melkizedek+ eze Selem,+ onye bụ́kwa onye nchụàjà Chineke Onye Kacha Elu,+ gakwara ka o zute Ebram. O nyere Ebram achịcha na mmanya.
19 O wee gọzie Ebram, sị:
“Ka Chineke, Onye Kacha Elu,
Onye kere eluigwe na ụwa, gọzie Ebram.
20 Ka otuto dịrị Chineke Onye Kacha Elu,
Onye nyefere ndị iro gị n’aka gị!”
Ebram wee nye ya otu ụzọ n’ụzọ iri n’ihe niile ọ kwatara n’agha.+
-