-
Jeremaya 31:31-34Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
31 Jehova kwuru, sị, “Oge na-abịa mgbe mụ na ndị Izrel na ndị Juda ga-agba ọgbụgba ndụ ọhụrụ.+ 32 Ọ gaghị adị ka ọgbụgba ndụ ahụ mụ na ndị nna nna ha gbara n’ụbọchị m seere ha n’aka si n’Ijipt kpọpụta ha,+ ‘ya bụ, ọgbụgba ndụ m hanwa mebiri,+ n’agbanyeghị na ọ bụ naanị m bụ onyenwe ha.’* Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.”
33 Jehova kwukwara, sị, “Ọgbụgba ndụ mụ na ndị Izrel ga-agba mgbe oge ahụ gachara* bụ na m ga-etinye iwu m n’ime ha,+ deekwa ya n’obi ha.+ M ga-abụ Chineke ha. Ha ga-abụkwa ndị m.”+
34 Jehova sịkwara, “A gaghịzi enwe onye ga-akụziri onye agbata obi ya na nwanne ya, sị, ‘Mara Jehova.’+ N’ihi na ha niile ga-ama m, malite n’onye kacha nta n’ime ha ruo n’onye kacha ukwuu.+ N’ihi na m ga-agbaghara ha ajọ omume ha. Agaghịzi m echeta mmehie ha.”+
-