-
Ndị Hibru 3:12, 13Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
12 Ụmụnna m, lezienụ anya ka onye ọ bụla n’ime unu ghara ịhapụ Chineke dị ndụ,+ nke ga-eme ka onye ahụ nwee ajọ obi na-enweghị okwukwe. 13 Ma, na-agbanụ ibe unu ume kwa ụbọchị ebe ọ bụ na anyị ka bi n’oge ahụ a kpọrọ “Taa,”+ ka onye ọ bụla n’ime unu wee ghara ikwe ka ike dị aghụghọ nke mmehie mee ka obi ya kpọchie.
-