29 Ama m na mgbe m na-anọghịzi ya, anụ ọhịa wolf ndị obi tara mmiri ga-abata ebe unu nọ.+ Ha agaghịkwa emere ìgwè atụrụ Chineke ebere. 30 Ụfọdụ ndị n’ime unu ga-ebidokwa ịna-ekwu ihe ndị na-abụghị eziokwu iji dọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha sowe ha.+
2Ma, e nwekwara ndị amụma ụgha n’Izrel otú ahụ ụfọdụ n’ime unu ga-abụkwa ndị nkụzi ụgha.+ Ha ga-eji nwayọọ malite òtù dị iche iche ga-eme ka unu kwụsị inwe okwukwe. Ha ga-agọnahụkwa onye gbapụtara ha.*+ A ga-ebibikwa ha ngwa ngwa n’ihi ihe a ha ga-eme.
2 M na-ede ihe a ka unu cheta okwu ndị amụma dị nsọ kwuru n’oge gara aga na ihe Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị kụziri, nke ndịozi* kụziiri unu. 3 Ihe unu kwesịrị ibu ụzọ mara bụ na n’oge ikpeazụ, a ga-enwe ndị na-achị ihe dị mma ọchị, ndị na-emekwa ihe ọjọọ na-agụ ha agụụ.+