9 Abụ m Jọn, nwanna unu, onye a na-akpagbu otú e si akpagbu unu,+ na onye na-atachi obi otú unu si atachi,+ na onye unu na ya ga-abụ eze n’Alaeze Chineke+ n’ihi na anyị na-eso ụzọ Jizọs.+ Anọ m n’agwaetiti a na-akpọ Patmọs n’ihi na m na-ekwu gbasara Chineke, na-agbakwa àmà banyere Jizọs.