2 Ekwere m unu nkwa na m ga-akpọrọ unu kpọnye Kraịst ka ọ lụwa unu. Achọkwara m ka unu dị ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke mgbe m ga-akpọgara unu ya.+ Ọ bụ ya mere ihe gbasara unu ji emetụ m n’obi otú o si emetụ Chineke.
27 Ofufe* dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ n’anya Chineke Nna anyị bụ: mmadụ inyere ụmụ na-enweghị nne na nna+ na ụmụ nwaanyị isi mkpe+ na-ata ahụhụ aka,+ nakwa mmadụ ịhụ na ụwa a emebighị ya.+
4 Ndị na-akwa iko,* ọ̀ bụ na unu amaghị na mmadụ bụrụ enyi ụwa, ọ ghọọla onye iro Chineke? N’ihi ya, onye ọ bụla nke chọrọ ịbụ enyi ụwa na-eme onwe ya onye iro Chineke.+