-
Mkpughe 13:16-18Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
16 Ọ na-amanyekwa mmadụ niile ka a kaa ha akara n’aka nri ha ma ọ bụ n’egedege ihu ha,+ ma ndị nta ma ndị ukwu, ma ndị ọgaranya ma ndị ogbenye, ma ndị nweere onwe ha ma ndị ohu. 17 Ọ na-emekwa ka a ghara inwe onye ga-azụ ihe ma ọ bụ ree ihe ma e wezụga onye nwere akara ahụ, ya bụ, aha+ anụ ọhịa ahụ ma ọ bụ nọmba nke aha ya.+ 18 Ka onye nwere ọgụgụ isi gbakọọ nọmba nke anụ ọhịa ahụ, n’ihi na ọ bụ nọmba mmadụ. Nọmba ya bụkwa narị isii na iri isii na isii (666).+ Ọ bụ naanị onye nwere amamihe ga-aghọta ihe a.
-
-
Mkpughe 20:4Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
4 Ahụrụ m ocheeze dị iche iche. E nyere ndị nọ ọdụ na ha ike ikpe ikpe. Ahụrụ m ọbara* ndị e gburu* maka na ha gbara àmà banyere Jizọs, gwakwa ndị mmadụ gbasara Chineke. Ndị a efeghị anụ ọhịa ahụ ma ọ bụ ihe yiri ya a kpụrụ akpụ, a kaghịkwa ha akara anụ ọhịa ahụ n’egedege ihu na n’elu aka ha.+ Ha wee dịrị ndụ ma soro Kraịst bụrụ eze,+ chịakwa otu puku (1,000) afọ.
-