-
Mkpughe 13:15-17Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
15 E nyekwara anụ ọhịa nke abụọ ahụ ike ime ka ihe ahụ yiri anụ ọhịa nke mbụ ahụ kuwe ume, ka ihe ahụ yiri anụ ọhịa ahụ nwee ike ịna-ekwu okwu, meekwa ka e gbuo ndị niile na-ekweghị efe yanwa.
16 Ọ na-amanyekwa mmadụ niile ka a kaa ha akara n’aka nri ha ma ọ bụ n’egedege ihu ha,+ ma ndị nta ma ndị ukwu, ma ndị ọgaranya ma ndị ogbenye, ma ndị nweere onwe ha ma ndị ohu. 17 Ọ na-emekwa ka a ghara inwe onye ga-azụ ihe ma ọ bụ ree ihe ma e wezụga onye nwere akara ahụ, ya bụ, aha+ anụ ọhịa ahụ ma ọ bụ nọmba nke aha ya.+
-