Jeremaya
47 Jehova gwara Jeremaya onye amụma okwu gbasara ndị Filistia+ tupu Fero emerie Gaza. 2 Jehova kwuru, sị:
“Mmiri si n’ebe ugwu sọrọ na-abịa.
Ọ ga-aghọ iyi tofere ókè.
Ọ ga-erikpukwa ala a na ihe niile dị na ya,
Rikpuokwa obodo a na ndị bi na ya.
Ndị nwoke ga-ebe ákwá.
Ndị niile bi n’ala a ga-ebekwa ákwá arịrị.
3 Mgbe ha ga-anụ ụda ụkwụ oké ịnyịnya onye iro,
Nụkwa mkpọtụ ụgbọ ịnyịnya agha ya,
Nakwa oké ụzụ nke ụkwụ ụgbọ ịnyịnya ya na-eme,
Ndị nna ga-agba ọsọ n’eleghị anya n’azụ
Maka na obi agaghị aka ha ịnapụta ụmụ ha.
4 Ụbọchị a ga-ebibi ndị Filistia niile eruwela.+
N’ụbọchị ahụ, a ga-ebibi onye ọ bụla fọdụrụ nke na-enyere Taya+ na Saịdọn+ aka.
E bibiela Ashkelọn.+
Ndị fọdụrụ na ndagwurugwu ha,
Olee mgbe unu ga-akwụsị ịna-ebekasị onwe unu ahụ́?+
Banye n’ọbọ gị.
Zuru ike, nọrọkwa jii.
7 Olee otú ọ ga-esi nọrọ jii
Ebe ọ bụ na Jehova agwala ya ihe ọ ga-eme?
Ọ gwara ya ka ọ lụso Ashkelọn na ụsọ oké osimiri agha.+
Ebe ndị a ka ọ gwara ya gaa.”