Ezra
4 Mgbe ndị iro Juda na Benjamin+ nụrụ na ndị ahụ si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta+ na-arụrụ Jehova bụ́ Chineke Izrel ụlọ nsọ, 2 ha bịakwutere Zerubabel na ndị isi ọnụmara dị iche iche ozugbo ma sị ha: “Ka anyị soro unu rụọ ụlọ a n’ihi na anyị so unu efe* Chineke unu.+ Anyị na-achụkwara ya àjà kemgbe oge Eze Isa-hadọn+ nke Asiria, bụ́ onye kpọtara anyị n’ebe a.”+ 3 Ma, Zerubabel na Jeshụa na ndị ọzọ bụ́ ndị isi ọnụmara n’Izrel sịrị ha: “E nweghị ihe jikọrọ anyị na unu n’ụlọ a anyị na-arụrụ Chineke anyị+ n’ihi na ọ bụ naanị anyị ga-arụrụ ya Jehova bụ́ Chineke Izrel, otú Eze Saịrọs bụ́ eze Peshia nyere anyị n’iwu.”+
4 Ndị ala ahụ wee na-eme ka obi ghara isi ndị Juda ike,* na-emekwa ka ike ịrụ ụlọ ahụ gwụ ha.+ 5 Ha goro ndị ndụmọdụ ka ha ghasaa atụmatụ ha+ n’oge niile Eze Saịrọs nke Peshia na-achị ruo n’oge Eze Darayọs+ chịwara Peshia. 6 Mgbe Ahazuirọs malitere ịchị, ha dere akwụkwọ ozi. N’akwụkwọ ozi ahụ, ha boro ndị bi na Juda na Jeruselem ebubo. 7 N’oge ọchịchị Eze Atazaksis nke Peshia, Bishlam, Mitridat, Tabiel, na ndị òtù ya ndị ọzọ, degaara Atazaksis bụ́ eze akwụkwọ ozi. Ha sụgharịrị ya n’asụsụ Arameik,+ jiri mkpụrụ akwụkwọ Arameik dee ya.*
8 * Rihọm, onye ọkwá ya gbagotere n’ọchịchị, na Shimshaị bụ́ odeakwụkwọ degaara Eze Atazaksis akwụkwọ ozi ma bo ndị bi na Jeruselem ebubo, sị: 9 (O si n’aka Rihọm, onye ọkwá ya gbagotere n’ọchịchị, na Shimshaị bụ́ odeakwụkwọ na ndị ọzọ ha na ha na-arụkọ ọrụ, ndị ikpe na ndị osote gọvanọ, ndị odeakwụkwọ, ndị Irek,+ ndị Babịlọn, ndị bi na Susa,+ ya bụ, ndị Ịlam,+ 10 na mba ndị ọzọ Asenapa onye ukwu a na-akwanyere ùgwù dọọrọ n’agha ma kpọta n’obodo ndị dị na Sameria,+ nakwa ndị ọzọ bi n’ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis.* Ugbu a, 11 ihe a bụ ihe e dere n’akwụkwọ ozi ha zigaara ya.)
“Eze Atazaksis, ndị na-ejere gị ozi, ndị bi n’ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis, na-edetara gị akwụkwọ ozi: Ugbu a, 12 ka eze mara na ndị Juu si n’ebe ị nọ bịakwute anyị erutela Jeruselem. Ha na-arụghachi obodo ọjọọ ahụ na-enupụ isi, ha na-achọkwa ịrụcha mgbidi ya+ na ịrụzi ntọala ya. 13 Ugbu a, ka eze mara na ọ bụrụ na a rụghachi obodo a, rụchaakwa mgbidi ya, ha agaghị atụ ụtụ isi, ụtụ ahịa,+ ma ọ bụ ụtụ ụzọ. Ọ ga-eme ka ndị eze ghara inweta ego ole ha kwesịrị ịna-enweta. 14 Ebe ọ bụ na anyị na-eri nnu si n’obí eze,* ọ dịghị mma ka anyị kwe ka e mebiere eze ihe. Ọ bụ ya mere anyị ji zite akwụkwọ ozi a ka anyị kọọrọ ya eze, 15 ka e wee nyochaa n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge nna nna gị hà.+ Ị ga-ahụ n’akwụkwọ ahụ, matakwa na obodo a bụ obodo na-enupụ isi ma na-akpatara ndị eze na ógbè* dị iche iche nsogbu. Malite n’oge gboo, e nwere ụfọdụ n’ime ha na-emegide ndị ọchịchị. Ọ bụ ya mere e ji bibie obodo a.+ 16 Anyị na-eme ka eze mara na ọ bụrụ na a rụghachi obodo a ma rụchaa mgbidi ya, ị gakwaghị na-achị ógbè* dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis.”+
17 Eze wee zigara Rihọm, onye ọkwá ya gbagotere n’ọchịchị, ozi, ya na Shimshaị bụ́ odeakwụkwọ na ndị ọzọ ha na ha na-arụkọ ọrụ, bụ́ ndị bi na Sameria na ndị ọzọ bi n’ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis. Ọ sịrị ha:
“Ana m ekele unu! Ugbu a, 18 a gụọrọla m* akwụkwọ ozi unu ziteere anyị nke ọma. 19 M nyere iwu, e mee nchọnchọ ma chọpụta na malite n’oge gboo, obodo ahụ na-emegide ndị eze. Ha na-enupụkwa isi ma na-akpata ọgba aghara.+ 20 E nwekwara ndị eze dị ike chịrị Jeruselem, ndị chịkwara ndị niile bi n’ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis. A kwụkwara ha ụtụ isi, ụtụ ahịa, na ụtụ ụzọ. 21 Nyenụ iwu ka ụmụ nwoke ndị a kwụsị ọrụ, ka a ghara ịrụghachi obodo ahụ ruo mgbe m nyere iwu. 22 Hụnụ na unu mere ihe a, ka a ghara imebikwuru eze ihe.”+
23 Mgbe a gụchaara Rihọm na Shimshaị bụ́ odeakwụkwọ na ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ akwụkwọ ozi Eze Atazaksis, ha gawara Jeruselem ozugbo, gakwuru ndị Juu ma manye ha ka ha kwụsị ọrụ ahụ. 24 Ọ bụ mgbe ahụ ka ọrụ a na-arụ n’ụlọ Chineke dị na Jeruselem kwụsịrị. Ọrụ ahụ kwụsịrị ruo n’afọ nke abụọ n’ọchịchị Eze Darayọs nke Peshia.+