Maịka
5 “Ugbu a, unu ndị bi n’obodo a nọchibidoro anọchibido,
Unu na-ebekasị onwe unu ahụ́.
A nọchibidola anyị.+
Ha ga-akụ onyeikpe Izrel mkpara na ntì.+
Ọ bụ na gị ka onye m ga-eme eze Izrel ga-esi pụta,+
Onye dịwara kemgbe oge ochie, kemgbe ọtụtụ afọ.
3 N’ihi ya, Chineke ga-enyefe ha n’aka ndị iro ha
Ruo mgbe nwaanyị ime na-eme ga-amụ nwa.
Mgbe ahụ, ụmụnne ya ndị fọdụrụ ga-alọghachikwute ndị Izrel.
4 Ọ ga-ebili ma jiri ike Jehova zụọ ha ka atụrụ,+
Jirikwa ebube nke aha Jehova bụ́ Chineke ya zụọ ha.
Ha ga-ebi ebe ahụ, ahụ́ eruokwa ha ala.+
Ọ ga-abụ onye ukwu n’ebe niile n’ụwa.+
Ọ bụrụ na onye Asiria abata n’ala anyị zọda ụlọ elu anyị,+
Anyị ga-esi n’ụmụ mmadụ họpụta ndị ọzụzụ atụrụ asaa na ndị isi* asatọ ga-alụso ya ọgụ.
Onye Asiria+ ahụ bata n’ala anyị ma zọọ ụkwụ na ya ịlụso anyị ọgụ,
Onye na-achị anyị ga-anapụta anyị n’aka ya.
7 N’anya ọtụtụ ndị, ndị fọdụrụ n’ezinụlọ Jekọb
Ga-adị ka igirigi nke si n’ebe Jehova nọ.
Ha ga-adịkwa ka mmiri nke na-ezo n’elu ahịhịa,
Nke na-anaghị eche ka mmadụ gwa ya ihe ọ ga-eme,
Nke na-anaghịkwa echere ụmụ mmadụ.
8 N’anya mba dị iche iche
Nakwa n’anya ọtụtụ ndị, ndị fọdụrụ n’ezinụlọ Jekọb
Ga-adị ka ọdụm nke nọ ebe anụ ọhịa ndị ọzọ nọ.
Ha ga-adịkwa ka ọdụm nọ ebe ìgwè atụrụ nọ,
Nke ọ na-abụ ọ na-agafe, ya ana-azọpịa ma na-adọri anụ ndị ọzọ.
E nweghịkwa onye na-anapụta ha.
9 Unu ga-emeri ndị iro unu.
A ga-ebibikwa ndị iro unu niile.”
10 Jehova kwuru, sị, “N’ụbọchị ahụ,
M ga-ebibi ịnyịnya unu na ụgbọ ịnyịnya unu.
11 M ga-ebibi obodo ndị dị n’ala unu,
Kwatuokwa ebe niile unu rụsiri ike.
13 M ga-ebibi arụsị unu a pịrị apị na ogidi unu.
Unu agaghịzi akpọrọ ihe unu ji aka unu rụọ isiala.+
15 M ga-eji iwe na ọnụma kwụọ
Mba ndị na-erubereghị m isi ụgwọ.”