Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ọnụ Ọgụgụ 11
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ọnụ Ọgụgụ

      • Chineke zitere ọkụ maka na ndị Izrel nọ na-eme mkpesa (1-3)

      • Ndị Izrel bere ákwá ka e nye ha anụ (4-9)

      • Mosis kwuru na ya erughị eru (10-15)

      • Jehova nyere ndị okenye iri asaa mmụọ nsọ (16-25)

      • Eldad na Midad; Joshụa kwochiteere Mosis ekworo (26-30)

      • Chineke zitere nnụnụ kwel; a tara ndị Izrel ahụhụ maka anyaukwu (31-35)

Ọnụ Ọgụgụ 11:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 32:11; Di 9:19; Ọm 106:23; Jes 5:16

Ọnụ Ọgụgụ 11:3

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Tabera pụtara “Nnukwu Ọkụ.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 9:22

Ọnụ Ọgụgụ 11:4

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    O nwere ike ịbụ ndị na-abụghị ndị Izrel so ha.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 12:37, 38; Le 24:10
  • +1Kọ 10:6, 10
  • +Ọm 78:18, 22; 106:14

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    3/1/1995, p. 16

Ọnụ Ọgụgụ 11:5

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 16:3

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ),

    11/2020, p. 25

    Ụlọ Nche,

    5/1/1992, p. 24

Ọnụ Ọgụgụ 11:6

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “mkpụrụ obi anyị.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 16:35; Ọg 21:5

Ọnụ Ọgụgụ 11:7

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “gọm.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 16:14; Neh 9:20; Jn 6:31
  • +Ọp 16:31

Ọnụ Ọgụgụ 11:8

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 16:16, 23

Ọnụ Ọgụgụ 11:9

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 78:24

Ọnụ Ọgụgụ 11:10

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 11:1

Ọnụ Ọgụgụ 11:11

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 17:4; Di 1:12

Ọnụ Ọgụgụ 11:12

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 13:14, 15; 26:3

Ọnụ Ọgụgụ 11:14

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 18:17, 18; Di 1:9

Ọnụ Ọgụgụ 11:15

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 19:2, 4; Job 6:8, 9

Ọnụ Ọgụgụ 11:16

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 16:18

Ọnụ Ọgụgụ 11:17

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 19:11; 25:22; 34:5; Ọg 12:5
  • +Ọg 11:25; 12:8
  • +1Sa 10:6; 2Ez 2:15; Neh 9:20; Ọrụ 2:17
  • +Ọp 18:21, 22

Ọnụ Ọgụgụ 11:18

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 19:10
  • +Ọp 16:7
  • +Ọg 11:4, 5
  • +Ọp 16:8

Ọnụ Ọgụgụ 11:20

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 78:29
  • +Ọg 21:5

Ọnụ Ọgụgụ 11:21

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 12:37; 38:26; Ọg 1:45, 46

Ọnụ Ọgụgụ 11:23

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “Aka Jehova ọ̀ dị mkpụmkpụ?”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 18:14; Aịz 59:1; Mk 10:27; Lu 1:37

Ọnụ Ọgụgụ 11:24

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 11:16

Ọnụ Ọgụgụ 11:25

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “malitere ibu amụma.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 33:9; Ọg 12:5; Di 31:15
  • +Ọm 99:7
  • +Ọg 11:17; 2Ez 2:9, 15
  • +1Sa 10:6; 19:20

Ọnụ Ọgụgụ 11:26

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ya bụ, n’ụlọikwuu nzute.

Ọnụ Ọgụgụ 11:28

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 17:9; 24:13; 33:11; Ọg 27:18-20; Di 31:3
  • +Mk 9:38

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ),

    1/2017, p. 30

Ọnụ Ọgụgụ 11:29

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ),

    1/2017, p. 30

    Ụlọ Nche,

    8/1/2004, p. 26

    9/15/1995, p. 18

Ọnụ Ọgụgụ 11:31

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Otu kubit bụ sentimita 44.5 (inch 17.5). Gụọ B14.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 16:13; Ọm 78:26, 27

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    9/1/2011, p. 14

Ọnụ Ọgụgụ 11:32

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Homa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu homa bụ lita 220. Gụọ B14.

  • *

    O nwere ike ịbụ na ha nọ na-eme ihe a ka anụ nnụnụ ndị ahụ kpọọ.

Ọnụ Ọgụgụ 11:33

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 78:30, 31; 1Kọ 10:10

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    3/1/1995, p. 16

Ọnụ Ọgụgụ 11:34

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Kibrọt-hateeva pụtara “Ebe E Liri Ndị Akpịrị Ogologo.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 33:16; Di 9:22
  • +1Kọ 10:6

Ọnụ Ọgụgụ 11:35

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 33:17

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Ọnụ Ọgụ. 11:2Ọp 32:11; Di 9:19; Ọm 106:23; Jes 5:16
Ọnụ Ọgụ. 11:3Di 9:22
Ọnụ Ọgụ. 11:4Ọp 12:37, 38; Le 24:10
Ọnụ Ọgụ. 11:41Kọ 10:6, 10
Ọnụ Ọgụ. 11:4Ọm 78:18, 22; 106:14
Ọnụ Ọgụ. 11:5Ọp 16:3
Ọnụ Ọgụ. 11:6Ọp 16:35; Ọg 21:5
Ọnụ Ọgụ. 11:7Ọp 16:14; Neh 9:20; Jn 6:31
Ọnụ Ọgụ. 11:7Ọp 16:31
Ọnụ Ọgụ. 11:8Ọp 16:16, 23
Ọnụ Ọgụ. 11:9Ọm 78:24
Ọnụ Ọgụ. 11:10Ọg 11:1
Ọnụ Ọgụ. 11:11Ọp 17:4; Di 1:12
Ọnụ Ọgụ. 11:12Je 13:14, 15; 26:3
Ọnụ Ọgụ. 11:14Ọp 18:17, 18; Di 1:9
Ọnụ Ọgụ. 11:151Ez 19:2, 4; Job 6:8, 9
Ọnụ Ọgụ. 11:16Di 16:18
Ọnụ Ọgụ. 11:17Ọp 19:11; 25:22; 34:5; Ọg 12:5
Ọnụ Ọgụ. 11:17Ọg 11:25; 12:8
Ọnụ Ọgụ. 11:171Sa 10:6; 2Ez 2:15; Neh 9:20; Ọrụ 2:17
Ọnụ Ọgụ. 11:17Ọp 18:21, 22
Ọnụ Ọgụ. 11:18Ọp 19:10
Ọnụ Ọgụ. 11:18Ọp 16:7
Ọnụ Ọgụ. 11:18Ọg 11:4, 5
Ọnụ Ọgụ. 11:18Ọp 16:8
Ọnụ Ọgụ. 11:20Ọm 78:29
Ọnụ Ọgụ. 11:20Ọg 21:5
Ọnụ Ọgụ. 11:21Ọp 12:37; 38:26; Ọg 1:45, 46
Ọnụ Ọgụ. 11:23Je 18:14; Aịz 59:1; Mk 10:27; Lu 1:37
Ọnụ Ọgụ. 11:24Ọg 11:16
Ọnụ Ọgụ. 11:25Ọp 33:9; Ọg 12:5; Di 31:15
Ọnụ Ọgụ. 11:25Ọm 99:7
Ọnụ Ọgụ. 11:25Ọg 11:17; 2Ez 2:9, 15
Ọnụ Ọgụ. 11:251Sa 10:6; 19:20
Ọnụ Ọgụ. 11:28Ọp 17:9; 24:13; 33:11; Ọg 27:18-20; Di 31:3
Ọnụ Ọgụ. 11:28Mk 9:38
Ọnụ Ọgụ. 11:31Ọp 16:13; Ọm 78:26, 27
Ọnụ Ọgụ. 11:33Ọm 78:30, 31; 1Kọ 10:10
Ọnụ Ọgụ. 11:34Ọg 33:16; Di 9:22
Ọnụ Ọgụ. 11:341Kọ 10:6
Ọnụ Ọgụ. 11:35Ọg 33:17
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
  • 24
  • 25
  • 26
  • 27
  • 28
  • 29
  • 30
  • 31
  • 32
  • 33
  • 34
  • 35
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Ọnụ Ọgụgụ 11:1-35

Ọnụ Ọgụgụ

11 Ndị Izrel malitere ime mkpesa n’ihu Jehova. Mgbe Jehova nụrụ ya, iwe were ya. Jehova wee zite ọkụ, ya amalite iregbu ụfọdụ ndị ná nsọtụ ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu. 2 Mgbe ha malitere ibesara Mosis ákwá, Mosis rịọsiri Jehova arịrịọ ike,+ ọkụ ahụ anyụọ. 3 A kpọziri ebe ahụ Tabera* maka na ọkụ Jehova zitere rere ha.+

4 Ndị dị iche iche*+ ha na ha so wee nwewe akpịrị ogologo.+ Ndị Izrel malitekwara ibe ákwá, na-asị: “Ònye ga-enye anyị anụ ka anyị taa?+ 5 Anyị na-echeta azụ̀ anyị na-ata n’Ijipt n’efu, nakwa kukumba, wọtamelọn, lik, yabaasị, na galik!+ 6 Ma ugbu a, ike na-agwụzi anyị.* E nweghị ihe ọzọ anyị na-ahụ ma ọ́ bụghị mana a.”+

7 Mana+ yiri mkpụrụ kọrịanda,+ ọ na-achakwa ka eso* deliọm. 8 Ndị Izrel na-agagharị kporo ya ma jiri nkume e ji egwe nri gwee ya ma ọ bụ sụọ ya n’ikwe, ha ejirizie ite e ji esi nri sie ya ma ọ bụ jiri ya mee achịcha dị okirikiri.+ Ọ na-atọ ka keeki dị ụtọ a gwara mmanụ. 9 Ọ na-abụ igirigi daa n’abalị n’ebe ha mara ụlọikwuu, mana adaakwa.+

10 Mosis nụrụ ka ndị Izrel na-ebe ákwá n’ezinụlọ n’ezinụlọ, onye nke ọ bụla n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ya. Ezigbo iwe were Jehova,+ ihe ahụ wutekwara Mosis. 11 Mosis wee sị Jehova: “Gịnị mere i ji emesi ohu gị ike? Gịnịkwa mere na ihe m amasịghị gị, i wee buru ibu mmadụ niile a bokwasị m?+ 12 Ọ̀ bụ m tụrụ ime ndị a niile? Ọ̀ bụ m mụrụ ha, nke mere i ji sị m, ‘Kuru ha n’obi gị otú onye na-elekọta nwa si eku nwa na-aṅụ ara,’ ka m wee kuba ha n’ala ị ṅụụrụ ndị nna nna ha iyi na ị ga-enye ha?+ 13 Olee ebe m ga-esi nweta anụ m ga-enye ndị a niile? N’ihi na ha na-ebesara m ákwá, sị, ‘Nye anyị anụ ka anyị taa!’ 14 Naanị m agaghị ebuli ibu mmadụ niile a. Ọ karịrị m akarị.+ 15 Ọ bụrụ otú a ka ị ga-esi na-emeso m, biko, gbuo m ozugbo.+ Ọ bụrụ na ihe m masịrị gị, ekwela ka m hụsikwuo anya.”

16 Jehova wee zaa Mosis, sị: “Si ná ndị okenye Izrel kpọkọtara m ụmụ nwoke iri asaa, ndị ị ma na ha bụ ndị okenye na ndị isi ndị Izrel.+ Kpọga ha n’ụlọikwuu nzute, meekwa ka gị na ha guzo n’ebe ahụ. 17 M ga-agbadata+ ma gwa gị okwu n’ebe ahụ.+ M ga-eweretụ mmụọ nsọ m+ dị n’ahụ́ gị nye ha. Ha ga-enyekwara gị aka n’ibu ibu ndị Izrel ka ị ghara ibu ya naanị gị.+ 18 Ị ga-agwa ndị Izrel, sị, ‘Meenụ onwe unu ka unu dị nsọ maka echi+ n’ihi na unu ga-ata anụ, n’ihi na unu ebeela ákwá ná ntị Jehova,+ sị: “Ònye ga-enye anyị anụ ka anyị taa? Ihe dịịrị anyị mma n’Ijipt.”+ Jehova ga-enye unu anụ, unu ga-atakwa anụ.+ 19 Ọ bụghị naanị otu ụbọchị ma ọ bụ ụbọchị abụọ ma ọ bụ ụbọchị ise ma ọ bụ ụbọchị iri ma ọ bụ ụbọchị iri abụọ ka unu ga-ata anụ, 20 kama unu ga-ataru ya otu ọnwa zuru ezu ruo mgbe ọ ga-apụta unu n’imi sọwa unu oyi,+ n’ihi na unu jụrụ Jehova, onye nọnyeere unu. Unu nọkwa na-ebe ákwá n’ihu ya, na-asị: “Gịnị mere anyị ji si n’Ijipt pụta?”’”+

21 Mosis wee sị: “Ndị a mụ na ha nọ dị narị puku ụmụ nwoke isii (600,000)+ ndị ji ụkwụ aga, ma i kwuru, sị, ‘M ga-enye ha anụ. Ha ga-ataru ya otu ọnwa zuru ezu.’ 22 E gbuo ìgwè ewu na atụrụ na ìgwè ehi, ọ̀ ga-ezuru ha? Ma ọ bụ, e gbute azụ̀ niile dị na mmiri, ọ̀ ga-ezuru ha?”

23 Jehova gwara Mosis, sị: “Ihe a ọ̀ nyịrị Jehova?*+ Ugbu a, ị ga-ahụ ma ihe m kwuru ọ̀ ga-emezuru unu ka ọ̀ bụ na ọ gaghị emezu.”

24 Mosis wee pụọ gwa ha ihe Jehova kwuru. Ọ kpọkọtara ụmụ nwoke iri asaa n’ime ndị okenye Izrel wee mee ka ha guzo n’akụkụ ụlọikwuu ahụ.+ 25 Jehova wee gbadata n’ígwé ojii+ gwa ya okwu.+ O weretụụrụ mmụọ nsọ+ dị n’ahụ́ ya nye ndị okenye iri asaa ahụ. Ozugbo ha nwetara mmụọ nsọ ahụ, ha malitere ime ka ndị amụma.*+ Ma, ha emeghị ya ọzọ.

26 E nwere mmadụ abụọ n’ime ụmụ nwoke ahụ ka nọ n’ebe ha mara ụlọikwuu. Aha ha bụ Eldad na Midad. Ha nwetara mmụọ nsọ maka na ha so ná ndị e dere aha ha n’akwụkwọ. Ma ha agabeghị n’ụlọikwuu.* Ha wee malite ime ka ndị amụma n’ebe ha mara ụlọikwuu. 27 Otu nwa okorobịa gbaara ọsọ gaa gwa Mosis, sị: “Eldad na Midad na-eme ka ndị amụma n’ebe anyị mara ụlọikwuu!” 28 Joshụa+ nwa Nọn, onye na-ejere Mosis ozi kemgbe ọ bụ okorobịa, kwuru, sị: “Onyenwe m Mosis, kwụsị ha ime otú ahụ.”+ 29 Ma Mosis sịrị ya: “Ị̀ na-ekwochitere m ekworo? Emela otú ahụ, n’ihi na ọ dị m ka ya bụrụ na ndị Jehova niile bụ ndị amụma nakwa na Jehova ga-enye ha mmụọ nsọ ya.” 30 Mgbe e mechara, Mosis gaghachiri n’ebe ha mara ụlọikwuu, ya na ndị okenye Izrel.

31 Jehova wee mee ka ifufe fewe. Ifufe ahụ si n’oké osimiri na-ebute nnụnụ kwel ma na-eme ka ha na-efedata n’ebe niile ndị Izrel mara ụlọikwuu.+ Ha fedatara ruo n’ebe ga-ewe otu ụbọchị iji garuo ya ná mpaghara niile, gbaa gburugburu ebe ha mara ụlọikwuu. Ha juru n’ala ruo ihe dị ka kubit* abụọ n’ịdị elu. 32 N’ihi ya, n’ehihie ụbọchị ahụ niile na n’abalị ya niile nakwa n’echi ya niile, ndị Izrel nọ na-anwụrụ nnụnụ kwel. E nweghị onye nwụtara nnụnụ kwel na-agaghị eju homa* iri. Ha nọ na-awụsara onwe ha nnụnụ ahụ gburugburu ebe niile ha mara ụlọikwuu.* 33 Ma mgbe ha ka kpụ anụ ahụ n’ọnụ, tupu ha ataa ya, Jehova wesara ha ezigbo iwe. Jehova wee gbuwe ọtụtụ n’ime ha.+

34 Ha wee kpọọ ebe ahụ Kibrọt-hateeva,*+ n’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka ha liri ndị ahụ nwere akpịrị ogologo.+ 35 Ndị Izrel si na Kibrọt-hateeva kwaga Hazirọt. Ha wee nọrọ na Hazirọt.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya