Jenesis
15 Mgbe ihe a mechara, Jehova gwara Ebram okwu n’ọhụụ, sị: “Ebram, atụla egwu.+ Abụụrụ m gị ọta.+ Ụgwọ ọrụ gị ga-adị nnọọ ukwuu.”+ 2 Ebram sịrị ya: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, gịnị ka ị ga-enye m, ebe ọ bụ na amụtabeghị m nwa, ebe ọ bụkwa Eliiza+ onye Damaskọs ga-eketa ụlọ m?” 3 Ebram sịkwara: “E nweghị nwa*+ ọ bụla i nyere m, ọ bụkwa ohu m* ga-anọchi m.” 4 Ma, Jehova gwara ya, sị: “Nwoke a agaghị anọchi gị, kama ọ bụ nwa gị* ga-anọchi gị.”+
5 Chineke wee kpọpụta Ebram n’èzí, sị ya: “Biko, lelie anya n’eluigwe gụọ kpakpando ndị a ọnụ ma ọ bụrụ na i nwere ike ịgụta ha ọnụ.” Chineke sịziri ya: “Otú a ka ụmụ* gị ga-adị ọtụtụ.”+ 6 O wee nwee okwukwe na Jehova,+ ya ejiri maka ya kpọọ ya onye ezi omume.+ 7 O kwukwara, sị: “Abụ m Jehova, onye kpọpụtara gị n’obodo Ọọ nke ndị Kaldia ka m wee nye gị ala a ka ọ bụrụ nke gị.”+ 8 O wee sị: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, olee otú m ga-esi mara na ọ ga-abụ nke m?” 9 Ọ sịrị ya: “Wetara m ehi gbara afọ atọ, nne ewu gbara afọ atọ, ebule gbara afọ atọ, otu nduru, na nwa kpalakwukwu.” 10 O wee weta ha niile, bọwaa ha abụọ abụọ ma dowe akụkụ nke ọ bụla ka ha chee ibe ha ihu. Ma ọ bọghị nnụnụ ndị ahụ abọ. 11 Nnụnụ ndị na-eri anụ wee malite ibe n’elu ozu anụ ndị ahụ, ma Ebram nọ na-achụpụ ha.
12 Mgbe anyanwụ chọwara ịda, oké ụra buuru Ebram, oké ọchịchịrị nke na-emenye ụjọ kpuchikwara ya. 13 Chineke wee sị Ebram: “Mara amara na ụmụ* gị ga-abụ ndị mbịarambịa n’ala na-abụghị nke ha. Ndị ala ahụ ga-eji ha mere ndị ohu ma mesie ha ike ruo narị afọ anọ (400).+ 14 Ma m ga-ekpe mba ahụ ha ga-agbara ohu ikpe.+ E mechaakwa, ụmụ gị ga-eburu ọtụtụ akụnụba laa.+ 15 Ma ị ga-anwụ n’udo mgbe i bichara ogologo ndụ.+ A ga-eli gị otú e liri ndị nna nna gị. 16 Ma ha ga-alọghachi n’ebe a+ n’ọgbọ nke anọ maka na iko ndị Amọraịt ejubeghị.”*+
17 Mgbe anyanwụ dara, oké ọchịchịrị agbaakwa, nnukwu ọkụ na-akwụ anwụrụ pụtara, ọwa ọkụ na-enwu ọkụ gafekwara n’agbata anụ ndị ahụ. 18 N’ụbọchị ahụ, Jehova na Ebram gbara ndụ.+ Ọ sịrị ya: “Ọ bụ ụmụ* gị ka m ga-enye ala a,+ malite n’osimiri Ijipt ruo ná nnukwu osimiri, bụ́ osimiri Yufretis,+ 19 ya bụ, ala ndị Kenaịt,+ ndị Kenizaịt, ndị Kadmọnaịt, 20 ndị Het,+ ndị Perizaịt,+ ndị Refeyim,+ 21 ndị Amọraịt, ndị Kenan, ndị Gegash, na ala ndị Jebus.”+