Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Timoti
4 Ma, Chineke ji mmụọ nsọ ya kwuo hoo haa na n’ọdịnihu, ụfọdụ ga-adapụ n’okwukwe, na-aṅa ntị n’ihe ndị na-abụghị eziokwu yiri ka ọ̀ bụ Chineke kwuru ha,+ na-aṅakwa ntị n’ihe ndị mmụọ ọjọọ na-akụzi. 2 Ha ga-aṅakwa ntị n’ụgha ndị ihu abụọ na-agha,+ ndị akọnuche ha nwụrụla ka ihe a dara ígwè ọkụ. 3 Ndị a ga-agwa ndị mmadụ ka ha ghara ịlụ di ma ọ bụ ịlụ nwaanyị,+ gwakwa ha ka ha ghara iri nri ụfọdụ.+ Ma, Chineke kere nri ndị a ka ndị nwere okwukwe,+ marakwa eziokwu nke ọma, na-eri ha+ ma na-ekele ya. 4 N’ihi na ihe niile Chineke kere dị mma.+ Ọ dịghịkwa ihe e kwesịrị ịjụ.+ E kwesịrị ikele Chineke, riekwa ha, 5 n’ihi na e ji okwu Chineke na ekpere doo ha nsọ.
6 Ọ bụrụ na ị na-agwa ụmụnna ihe ndị a, ị ga-abụ ezigbo onye ozi Kraịst Jizọs na onye ji ihe ndị na-eme ka okwukwe mmadụ sie ike na-azụ onwe ya, onye jikwa ọmarịcha ihe Chineke na-akụziri anyị, ndị i jisiri aka ike, na-azụ onwe ya.+ 7 Egekwala akụkọ ụgha na-enweghị isi,+ ụdị ahụ ụfọdụ ndị agadi nwaanyị na-akọ. Kama, na-azụ onwe gị ka ị bụrụ onye na-efe Chineke. 8 N’ihi na mmadụ ịzụ ahụ́ ya* bara obere uru. Ma, ife Chineke otú ọ chọrọ bara uru n’ihe niile, n’ihi na ọ bara uru ná ndụ anyị dị ugbu a. Ọ ga-abakwara anyị uru ná ndụ anyị ga-adị n’ọdịnihu.+ 9 Ihe a m na-ekwu bụ eziokwu, mmadụ kwesịkwara iji obi ya niile nabata ya. 10 Ọ bụ ya mere anyị ji na-arụsi ọrụ ike, na-agbasikwa mbọ ike n’ihe niile anyị na-eme,+ n’ihi na anyị tụkwasịrị Chineke dị ndụ obi, onye bụ́ Onye Nzọpụta+ nke ụdị mmadụ niile,+ karịchaa, ndị ji obi ha niile na-efe ya.
11 Na-akụzi ihe ndị a, na-agwakwa ha ndị mmadụ. 12 Emela ihe ga-eme ka onye ọ bụla lelịa gị anya maka na ị bụ nwata. Kama nke ahụ, ka otú i si ekwu okwu, otú i si akpa àgwà, otú i si hụ ndị ọzọ n’anya, otú i si nwee okwukwe, na otú i si ebi ndụ dị ọcha bụrụ ihe ndị ji obi ha niile na-efe Chineke ji ama atụ. 13 Tupu mụ abịa, na-agbasi mbọ ike n’ịgụpụta ihe n’ihu ọha,+ n’ịdụ ndị ọzọ ọdụ,* nakwa n’izi ihe. 14 Elegharala onyinye Chineke nyere gị anya. O nyere gị onyinye a mgbe e buru amụma gbasara gị, ndị okenye ebikwasịkwa gị aka n’isi.+ 15 Na-echebara ihe ndị a echiche.* Ka obi gị niile dịrịkwa na ha, ka mmadụ niile wee hụ na ị na-eme nke ọma n’ọgbakọ. 16 Na-eme ike gị niile ka ị bụrụ onye e ji ama atụ nakwa onye na-akụzi ihe nke ọma.*+ Na-eme ihe ndị a, n’ihi na ọ ga-eme ka ị zọpụta onwe gị, zọpụtakwa ndị na-ege gị ntị.+