Gịnị Mere Anyị Nile Kwesịrị Iji Too Chineke?
HALELUJA! Ihe ka ọnụ ọgụgụ ná ndị na-aga chọọchị na Krisendọm maara okwu a nke ọma. Ụfọdụ n’ime ha na-eti ya ná mkpu n’ụka Sunday ha. Ma, òle maara ihe okwu ahụ pụtara n’ezie? N’ezie, ọ bụ okwu Hibru maka “Toonụ Ja!” Ọ bụ abụ otuto na-enye ọṅụ, nke na-adasi ike, maka Onye Okike, onye aha ya bụ Jehova.a
Okwu ahụ bụ “Haleluja” pụtara ọtụtụ ugbo n’ime Bible. N’ihi gịnị? N’ihi na e nwere nnọọ ọtụtụ ihe mere a ga-eji too Chineke. Ja (Jehova) bụ Onye Okike na Onye Nkwagide nke eluigwe na ala sara mbara. (Abụ Ọma 147:4, 5; 148:3-6) O hiwere usoro ndụ na ebe obibi nke na-eme ka ndụ nwee ike ịdị n’ụwa. (Abụ Ọma 147:8, 9; 148:7-10) Ọ na-enwekwa mmasị pụrụ iche n’ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ bụrụ na anyị emee uche ya, ọ na-agọzi ma na-akwado anyị ná ndụ a ma na-enye anyị olileanya e ji n’aka nke ọbụna ndụ ka mma nke na-abịa. (Abụ Ọma 148:11-14) Ọ bụ Ja (Jehova) mere ka e kwuo okwu ndị a: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29.
N’ihi ya, e nyere mmadụ nile agbamume ahụ: “Haleluja!” “Toonụ Ja!” (Abụ Ọma 104:35, nkọwa ala ala peji, NW) Ma, n’ụzọ dị mwute, ọ bụghị mmadụ nile na-achọ ịnakwere ya. Taa, ndị mmadụ na-ata ahụhụ. Ọtụtụ nọ n’agụụ, ọrịa, ma ọ bụ ná mmegbu. Ọtụtụ na-edi iru újú dị ukwuu n’ihi iji ọgwụ ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ma ọ bụ n’ihi ihe ndị sitere n’omume ha rụrụ arụ ma ọ bụ nnupụisi. È nwere ihe mere ndị dị otú ahụ kwesịrị iji too Chineke?
‘Nanị Jehova Pụrụ Inye M Olileanya’
Ee, e nwere. Jehova na-akpọ onye ọ bụla òkù n’enweghị onye ọ gụpụrụ ịbịa mara ya, mụta ime uche ya, ma nweta ngọzi ndị na-eme ka ndị mmadụ chọọ ito ya. Ọtụtụ na-azaghachikwa. Were Adriana bi na Guatemala, dị ka ihe atụ. Mgbe Adriana dị afọ asaa, nne ya nwụrụ. N’oge na-adịghị anya nke ahụ gasịrị nna ya hapụrụ ụlọ. Mgbe ọ dị afọ iri, ọ malitere ịrụ ọrụ iji nweta ihe e ji ebi ndụ. Ebe nne ya gwaworo ya ka o jeere Chineke na chọọchị ozi, Adriana sonyeere òtù Katọlik dị iche iche, ma ka ọ na-eru afọ 12, ike gwụrụ ya, o sonyekwara otu òtù na-eme ihe ike n’okporo ámá. Ọ malitere ise siga, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, na izu ohi. N’ihi gịnị ka nwa agbọghọ dị otú ahụ ga-eji chọọ ito Chineke?
Nwanne nwanyị Adriana malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, ma Adriana chịrị ya ọchị. E mesịa dada ha anwụọ. N’olili ozu dada ha, ajụjụ ndị na-agbakasị ahụ nyere Adriana nsogbu. Ebee ka dada ya gara? Ọ̀ nọ n’eluigwe? Ọ̀ gara ọkụ mmụọ? Ọ bụ oké ihe mgbagwoju anya, Adriana gakwara n’ụlọ ekpere dị n’ebe ili ozu ahụ ikpe ekpere maka enyemaka, na-eji aha Chineke bụ́ Jehova eme ihe, dị ka nwanne ya nwanyị kụziwooro ya.
N’oge na-adịghị anya o so Ndịàmà Jehova na-amụ Bible ma na-aga nzukọ ndị Kraịst ha. Nke a megheere ya echiche dịwagara ọhụrụ banyere ndụ, o jikwa obi ike gbubie ihe nile jikọrọ ya na òtù na-eme ihe ike n’okporo ámá. Adriana, nke nọ n’ugbu a n’etiti afọ ndị nke 20 ya, na-asị: “Nanị ịhụnanya maka Jehova mere ka m hapụ ajọ ụzọ ndụ dị otú ahụ. Nanị Jehova n’oké ebere ya pụrụ inye m olileanya nke ndụ ebighị ebi.” Adriana, n’agbanyeghị mmalite ya siri ike ná ndụ, nwere ihe ndị magburu onwe ha mere ọ ga-eji too Chineke.
E si Ukraine weta akụkọ nke ọnọdụ ọbụna nke yiri ka ọ ka gbaa ọchịchịrị. Otu nwoke nọdụ ala n’ụlọ mkpọrọ na-eche ogbugbu. Ọ̀ na-emere onwe ya ebere? Daa mba n’obi? Ee e, ọ dịghị ma ọlị. Ebe Ndịàmà Jehova zuteworo ya n’oge na-adịbeghị anya, o nwetakwa ihe ọmụma ụfọdụ banyere Jehova, ọ gwara ha ka ha jekwuru nne ya. Ugbu a ọ na-edere ha akwụkwọ n’ihi na ọ nụwo na ha mezuru arịrịọ ya. Ọ na-asị: “Ekelee mụ unu n’ihi ileta nne m. Ọ bụ ozi kasị enye ọṅụ m nwetaworo eri afọ gara aga.”
N’ikwu banyere onwe ya na ndị nga ibe ya ọ gbawooro àmà, ọ na-ede, sị: “Ugbu a anyị nwere okwukwe na Chineke, na-agbalịkwa ime ihe kwekọrọ n’okwukwe anyị.” O mechiri akwụkwọ ozi ya, sị: “Ekelee mụ unu maka inyere anyị aka ịmụta ihe ịhụnanya bụ na inweta okwukwe. Ọ bụrụ na mụ adịrị ndụ, m ga-enyekwara unu aka. Ekele dịrị Chineke na unu dị nakwa na unu na-enyere ndị ọzọ aka ịhụ Chineke n’anya na ikwere na ya.” Nwoke a etinyewo akwụkwọ mkpegharị ikpe ọnwụ ya. Ma ma è gburu ya egbu ma ọ nọrọ ọtụtụ afọ n’ụlọ mkpọrọ, o doro anya na o nwere ihe mere ọ ga-eji too Chineke.
‘Ọ Bụ Ezie na M Kpuru Ìsì, Apụrụ M Ịhụ Ụzọ’
Ugbu a, tụlee otu nwa agbọghọ jupụtara ná ndụ bụ́ onye kpuru ìsì na mberede. Nke ahụ bụ ihe mere Gloria, onye bi n’Argentina. Gloria nọkatara kpuo ìsì mgbe ọ dị afọ 19, ọ hụkwaghị ụzọ ọzọ. Mgbe ọ dị afọ 29 ọ gara ghọọrọ otu nwoke iko nwanyị, ngwa ngwa kwa ọ tụụrụ ime. Ugbu a o chere na ndụ ya nwere nzube. Ma mgbe nwa ya nwụrụ, ọ malitere ịjụ ajụjụ. Ọ jụrụ sị, ‘Gịnị mere nke a ji na-eme m? Gịnị ka m meworo? Chineke ọ̀ dị adị n’ezie?’
N’oge a, Ndịàmà Jehova abụọ bịara n’ọnụ ụzọ ya. Ọ malitere ịmụ Bible ma mụta banyere nkwa ya nke na n’ụwa ọhụrụ, ndị ìsì ga-ahụ ụzọ ọzọ. (Aịsaịa 35:5) Lee atụmanya magburu onwe ya ọ bụ nye Gloria! Obi dị ya ụtọ nke ukwuu, karịsịa mgbe di ya kwere ime ka alụmdi na nwunye ha kwekọọ n’iwu. Mgbe ahụ di ya nwere ihe ọghọm ma daa ngwụrọ, na-anọ n’oche nkwagharị mgbe nile. Taa nwanyị ìsì a aghaghị ịrụsi ọrụ ike iji nweta ihe e ji ebi ndụ. Tụkwasịkwa, ọ na-arụ ọrụ nile dị n’ụlọ, tinyekwara ịdị na-elekọta di ya n’onwe ya. Ma Gloria na-eto Jehova! Site n’enyemaka ụmụnna ya ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst, ọ na-amụ Bible e dere na Braille, nzukọ ndị Kraịst n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na-agbakwa ya ume nke ukwuu. Ọ na-asị: “O siri ike ịkọwa, ma ọ bụ ezie na m kpuru ìsì, ọ bụ dị ka apụrụ m ịhụ ụzọ.”
Mgbe ụfọdụ a na-akpagbu ndị mmadụ mgbe ha na-eto Chineke. Obi dị otu nwanyị na Croatia ụtọ mgbe ọ mụtara banyere Chineke, ma di ya megidere okwukwe ọ chọtara ọhụrụ ma jụ ya, na-akpọrọ nwa ha nwanyị gbara otu afọ. N’okporo ámá, n’ịbụ onye di na ezinụlọ gbahapụrụ, n’enweghị ụlọ, ọrụ, ma ọ bụ ọbụna nwa, obi gbawasịrị ya na mbụ. Ma ịhụnanya ya maka Chineke kwagidere ya, ọ bụ ezie na ya na nwa ya nwanyị na-enwe nanị mmekọrịta dị nta ruo mgbe nwatakịrị ahụ tolitere. Nwanyị a achọtawo “pearl dị oké ọnụ ahịa,” ọ gaghịkwa ahapụ ya. (Matiu 13:45, 46) Olee otú o si jigide ọṅụ ya n’oge ndị a siri ike? Ọ na-asị: “Ọṅụ bụ mkpụrụ nke mmụọ Chineke. A pụrụ ịzụlite ya n’adabereghị n’ọnọdụ ndị dị n’èzí, dị nnọọ ka ihe ubi pụrụ ito n’ọnụ ụlọ ebe a na-azụ ihe ọkụkụ ihe ọ sọrọ ọnọdụ ihu igwe bụrụ n’èzí.”
Na Finland, a chọpụtara na Markus dị afọ isii nwere ọrịa uru ahụ na-enweghị ngwọta. N’oge na-adịghị anya e nyere ya oche nkwagharị. Afọ ole na ole n’ihu, nne ya kpọgaara ya otu onye Pentikọstal malitere iwu ewu site n’ịzọrọ na ya na-agwọ ndị ọrịa. Ma e nweghị ọgwụgwọ ọrụ ebube ọ bụla. Ya mere Markus enwekwaghị mmasị na Chineke ma chụsoo mmụta na sayensị na mmụta ndị ọzọ nke ụwa. Mgbe ahụ n’ihe dị ka afọ ise gara aga, otu nwanyị nọ n’oche nkwagharị nke ya na otu nwa okorobịa so bịara n’ụlọ ebe Markus bibu. Ha bụ Ndịàmà Jehova. Markus bụ ugbu a onye na-ekweghị na Chineke, ma o nweghị ihe ọ bụla megide ịkpa banyere okpukpe, o wee kpọbata ha.
E mesịa, otu di na nwunye letara ya, a malitekwara ọmụmụ Bible. N’ikpeazụ, ike nke eziokwu Bible gbanwere ụzọ Markus si ele ihe anya, ọ ghọtakwa na n’agbanyeghị ọrụsị ya, o nwere n’ezie ihe ndị mere ọ ga-eji too Chineke. Ọ sịrị: “Obi dị m ụtọ nke ukwu n’ihi na achọtawo m eziokwu ahụ na nzukọ Jehova ji eme ihe. Ndụ m nwere nduzi na nzube ugbu a. A chọtawo atụrụ ọzọ furu efu, ọ chọkwaghị ịhapụ ìgwè atụrụ Jehova!”—Tụlee Matiu 10:6.
Ka Mmadụ Nile “Too Ja”
Ndị a bụ nanị ole na ole n’ọtụtụ ahụmahụ a na-apụghị ịgụta ọnụ ndị a pụrụ ịkọ iji gosi na ụmụ mmadụ taa, n’agbanyeghị ihe bụ ọnọdụ ha, pụrụ inwe ihe mere ha ga-eji too Chineke. Pọl onyeozi kọwara ya otú a: “Nsọpụrụ Chineke bara uru nye ihe nile, ebe o nwere nkwa nke ndụ, ma nke ndụ ugbu a, ma nke gaje ịbịa.” (1 Timoti 4:8) Anyị mee uche Chineke, ọ ga-emezu “nkwa nke ndụ . . . ugbu a.” Otú ọ dị, ọ gaghị eme ka ndị ogbenye baa ọgaranya ma ọ bụ ka ahụ dị ndị ọrịa ike n’usoro ihe dị ugbu a. Ma ọ na-enye ndị na-ejere ya ozi mmụọ ya ka ha wee nweta ọṅụ na afọ ojuju n’agbanyeghị ihe bụ ọnọdụ ha n’elu ahụ. Ee, ọbụna ná “ndụ ugbu a,” ndị ọrịa, ndị a na-emegbu, na ndị ogbenye pụrụ inwe ihe mere ha ga-eji too Chineke.
Ma gịnị banyere ndụ “nke gaje ịbịa”? Ee, nanị iche banyere ya kwesịrị ime ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi kasịnụ too Chineke! Ọ na-akpali anyị akpali iche banyere oge mgbe a na-agakwaghị ama ihe bụ ịda ogbenye; mgbe “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa”; na mgbe Jehova Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.” (Aịsaịa 33:24; Mkpughe 21:3, 4; Abụ Ọma 72:16) Olee otú i si ele nkwa ndị a sitere n’ọnụ Chineke anya?
Otu nwa okorobịa n’El Salvador nakweere otu traktị Bible nke na-akọwa ụfọdụ n’ime ihe ndị a. Ọ gwara Onyeàmà nyere ya ya sị, “Nne, ihe traktị a na-ekwu magburu onwe ya ịbụ eziokwu.” Ọ na-adị ọtụtụ ndị otú ahụ. Ma, ndị a bụ nkwa nke Onye kere eluigwe na ala, onye tinyere ihe nile na-erugharị n’ụwa anyị n’ọrụ, na onye na-enyere ọbụna ndị ogbenye na ndị ọrịa aka inweta ọṅụ. Anyị pụrụ ikwere ihe ọ na-ekwu. Nwa okoro ahụ e hotara n’elu so Ndịàmà Jehova mụọ Bible ma chọpụta na nke a bụ eziokwu. Ọ bụrụ na ị malitebeghịrịị ime nke a, anyị na-agba gị ume ka i mee otu ihe ahụ. Mgbe ahụ, ka ị nọrọ ya mgbe usoro ihe dị ugbu a ga-apụ n’anya, ihe nile e kere eke esonyekwa n’iti mkpu, sị: “Haleluja!” Toonụ Ja!”—Abụ Ọma 112:1; 135:1.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’ime Bible, mgbe ụfọdụ a na-edebiri “Jehova” ka ọ bụrụ “Ja.”
[Foto dị na peeji nke 5]
Ka ị nọrọ ya mgbe ihe nile e kere eke na-esonye n’iti mkpu, sị: “Haleluja!”