Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/05 p. 1
  • ‘Ndị E Ji Okwu Okwukwe Zụọ’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Ndị E Ji Okwu Okwukwe Zụọ’
  • Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘Ndị E Mere Ka Ha Zuo Okè Ịrụ Ezi Ọrụ Nile Ọ Bụla’
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Nzukọ Na-abara Ndị Na-eto Eto Uru
    Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Ị̀ Na-erizi Ihe n’Ụzọ Ime Mmụọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ọ “Na-enye Onye Dara Mbà Ike”
    Ozi Alaeze Anyi—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2005
km 1/05 p. 1

‘Ndị E Ji Okwu Okwukwe Zụọ’

1 Ibi ndụ n’ụzọ na-ewetara Chineke nsọpụrụ na-achọ mgbalị siri ike. (1 Tim. 4:7-10) Ọ bụrụ na anyị ebiwe ụdị ndụ a n’ike nke anyị, ike ga-agwụ anyị ngwa ngwa, anyị ga-akwụsịkwa ibi ya. (Aịsa. 40:29-31) Otu ụzọ anyị pụrụ isi nweta ike n’aka Jehova bụ site n’ịbụ ‘ndị e ji okwu okwukwe zụọ.’—1 Tim. 4:6.

2 Nri Ime Mmụọ Na-edozi Ahụ́: Site n’Okwu ya nakwa site n’aka “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche,” Jehova na-enye anyị nri ime mmụọ na-edozi ahụ́. (Mat. 24:45) Ànyị na-eme ihe anyị kwesịrị ime iji rite uru na ya? Ànyị na-agụ Bible kwa ụbọchị? Ànyị nwere oge nke anyị wepụtara maka ọmụmụ ihe onwe onye na ntụgharị uche? (Ọma 1:2, 3) Nri ime mmụọ dị otú ahụ, bụ́ nke na-edozi ahụ́, na-enye anyị ume ma na-echebe anyị pụọ ná mmetụta ndị na-agwụ ike nke ụwa Setan. (1 Jọn 5:19) Ọ bụrụ na anyị na-etinye ihe ndị kwesịrị ekwesị n’uche ma na-eji ha eme ihe ná ndụ anyị, Jehova ga-anọnyere anyị.—Fil. 4:8, 9.

3 Jehova na-enyekwa anyị ume site ná nzukọ ọgbakọ. (Hib. 10:24, 25) Ndụmọdụ ime mmụọ na mkpakọrịta na-ewuli elu a na-enweta ná nzukọ ndị a na-ewusi anyị ike iguzo kwem n’agbanyeghị ọnwụnwa. (1 Pita 5:9, 10) Otu nwa agbọghọ bụ́ Onye Kraịst kwuru, sị: “Ana m aga akwụkwọ kwa ụbọchị, ọ na-akụdakwa mmụọ m. Ma nzukọ anyị dị ka mmiri na ndo nke dị n’ọzara, bụ́ ebe m na-enweta ume ọhụrụ iji nagide ihe ndị m ga-eche ihu n’ụlọ akwụkwọ n’echi ya.” Lee ngọzi anyị na-enweta maka mgbalị anyị na-etinye n’ịga nzukọ!

4 Ikwusa Eziokwu Ahụ: Ikwusara ndị ọzọ ozi ọma ahụ dị ka nri nye Jizọs. O nyere ya ume. (Jọn 4:32-34) N’otu aka ahụ, mgbe anyị na-akọrọ ndị ọzọ banyere nkwa ndị dị ebube Chineke kwere, ọ na-enye anyị ume ọhụrụ. Iji ozi ahụ akpọrọ ihe na-emekwa ka obi anyị nakwa uche anyị dịrị n’Alaeze ahụ nakwa ná ngọzi ndị ọ ga-eweta n’isi nso. Nke ahụ na-enye ume ọhụrụ n’ezie.—Mat. 11:28-30.

5 Lee nnọọ ihe ùgwù anyị nwere ịbụ ndị na-erite uru ná nri ime mmụọ na-edozi ahụ́ Jehova na-enye ndị ya taa! Ka anyị nọgide na-eti mkpu ọṅụ iji wetara ya otuto.—Aịsa. 65:13, 14.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya