‘Ndị E Mere Ka Ha Zuo Okè Ịrụ Ezi Ọrụ Nile Ọ Bụla’
1 E ji ụba nri ime mmụọ bara uru gọzie ndị Jehova taa. (Aịsa. 25:6) E nwere ọtụtụ akwụkwọ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ ndị a ga-erite uru na ha site n’ọmụmụ ihe onwe onye na nke ezinụlọ na ná nzukọ ọgbakọ, na mgbakọ dị iche iche. Ma ànyị na-eji ihe a nile eme ihe n’ụzọ zuru ezu n’ebumnobi nke ịghọ ‘ndị e mere ka ha zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla’?—2 Tim. 3:17.
2 Cheedị nnọọ banyere nri ime mmụọ e nwere maka afọ 1998, nke gawororị ọkara! Site ná nzukọ ọgbakọ kwa izu, anyị na-atụle isi ihe ụfọdụ ndị sitere n’akwụkwọ 23 nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, na-atụleghachi ihe ọmụma dị n’Isiokwu Dị Iche Iche nke Bible Maka Nkwurịta Okwu, na-atụlekwa isiokwu ndị a họtara na magazin Ụlọ Nche nke 1996. Anyị na-atụleghachikwa otu ụzọ n’ụzọ atọ nke akwụkwọ Ihe Ọmụma, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ n’ozuzu ya, na akwụkwọ Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ dum. Ọzọkwa, e ji mbipụta 12 nke Ozi Alaeze Anyị, isiokwu 52 dịịrị ọmụmụ n’Ụlọ Nche, na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okwu ihu ọha hakwa otú ahụ n’isiokwu dị iche iche nke Bible na-azụ anyị. Usoro ihe omume jupụtara n’ihe ọmụma nke mgbakọ dị iche iche sokwa n’ihe a nile. Lee ihe ọma ime mmụọ dị ukwuu e nyeworo anyị!
3 Nwee Ekele Maka Ndokwa Jehova: Iji rite uru n’ụzọ zuru ezu, ọ dị anyị mkpa ịghọta ihe mere Jehova ji na-enye ụbara ihe ime mmụọ dị otú ahụ. Iriju ihe ọma ndị a afọ na-ewuli okwukwe anyị elu ma na-ewusi mmekọrịta anyị na ya ike. (1 Tim. 4:6) Otú ọ dị, a dịghị enye nri ime mmụọ nanị iji nye anyị ntụziaka. Ọ na-akpali anyị isoro ndị ọzọ kerịta eziokwu ma na-akwadebe anyị ịdị irè n’ime otú ahụ dị ka ndị ozi nke ozi ọma ahụ.—2 Tim. 4:5.
4 Ka anyị ghara ileghara mkpa ime mmụọ anyị anya, kama ka anyị na-azụlite mgbe nile agụụ maka nri ime mmụọ bara uru, nke na-eju afọ sitere na table Jehova. (Mat. 5:3; 1 Pita 2:2) Irite uru n’ụzọ zuru ezu chọrọ iwepụta oge zuru ezu maka ihe ndị dị mkpa dị ka ọmụmụ Bible onwe onye na nke ezinụlọ chiri anya na ịga nzukọ mgbe nile. (Efe. 5:15, 16) Ụgwọ ọrụ na-enye obi ụtọ nke ime otú ahụ ga-ekwekọ n’agbamume ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ nke Pọl degaara ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị Hibru, dị ka e dekọrọ ná Ndị Hibru 13:20, 21.