Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/00 p. 3-4
  • Ị̀ Na-erite Uru?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-erite Uru?
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nzukọ Ndị ‘Na-akpali Anyị Inwe Ịhụnanya na Ịrụ Ezi Ọrụ’
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Izukọta Ọnụ Na-efe Jehova
    Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
  • Nzukọ Na-abara Ndị Na-eto Eto Uru
    Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Na-erite Uru Zuru Ezu ná Nzukọ Maka Ozi Ubi
    Ozi Alaeze Anyi—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 8/00 p. 3-4

Ị̀ Na-erite Uru?

1 Ọtụtụ nde ndị mmadụ taa chọrọ ịma otú a ga-esi edozi nsogbu dị iche iche ma nwee ndụ obi ụtọ. Ha na-agụ akwụkwọ enyemaka onwe onye ma ọ bụ na-elegara ìgwè na òtù dị iche iche anya maka ndụmọdụ n’ụzọ isi mee ka ndụ ha ka mma. Ma eleghị anya ụfọdụ pụrụ izo aka ná ntakịrị abamuru ndị ha nwetaworo. Ma, dabere n’ụdị ndụ a na-adị taa, ndị mmadụ n’ozuzu ha, hà esitewo n’usoro ntụziaka nke mmadu mụta ịdị ndụ n’udo, n’ụzọ na-eweta afọ ojuju dị ukwuu? Ọ dịghị ma ọlị!—1 Kọr. 3:18-20.

2 N’aka nke ọzọ, Onye Okike anyị na-enye ndị nile ga-ege ntị ntụziaka kasị abara ha uru n’efu. Jehova chọrọ ka mmadụ nile rite uru site ná nkụzi ya. O jiriwo mmesapụ aka nye Okwu ya e dere site n’ike mmụọ nsọ iji duzie ihe a kpọrọ mmadụ n’izi ezi, o mewokwa ka e kwusaa ozi ọma nke Alaeze ya n’ụwa nile. (Abụ Ọma 19:7, 8; Mat. 24:14; 2 Tim. 3:16) E jikọtara kpọmkwem ndụ obi ụtọ n’ezie na ịṅa ntị n’ihe ndị Jehova nyere n’iwu.—Aịsa. 48:17, 18.

3 Nduzi Jehova karịrị nnọọ nke akwụkwọ enyemaka onwe onye ọ bụla ma ọ bụ usoro mmeziwanye ihe n’onwe onye nke ụwa, na-enye. Anyị pụrụ inweta ezi enyemaka na uru na-adịgide adịgide ma ọ bụrụ na anyị ejiri ndokwa ndị Jehova mere dị ka e depụtara ha n’Okwu ya ma na-akụzi ha ná nzukọ ya mee ihe n’ụzọ zuru ezu.—1 Pita 3:10-12.

4 Rite Uru ná Nzukọ Ọgbakọ: Taa, Jehova na-egosi ezi mmasị n’ịkụziri anyị ụzọ ya, anyị na-eritekwa uru site n’ịṅa ntị ná ntụziaka ya. Nzukọ ise anyị na-enwe kwa izu bụ ihe àmà nke mmetụta ịhụnanya Jehova. Mgbe anyị gara nzukọ ọgbakọ, ihe ọmụma anyị nwere banyere Chineke na-amụba. Anyị na-amụta ụzọ isi chebe onwe anyị pụọ n’ihe ọjọọ site n’ịbịaru Jehova nso. N’ụzọ dị otú a, a na-ewulikwa mmụọ anyị elu.

5 E nwere ihe ndị ọzọ. Anyị na-enwe ike ‘ịdị obodobo’ ná nzukọ ọgbakọ. (2 Kọr. 6:13) Nke a na-agụnye ịmara ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ. Anyị na-erite uru site n’ịgbarịta ibe anyị ume, dị ka Pọl onyeozi dere n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom. (Rom 1:11, 12) Mgbe ọ na-edegara ndị Hibru akwụkwọ, ọ dụsiri ndị pụrụ ịdị na-azụlite àgwà nke ịhapụ mkpakọrịta ndị Kraịst ọdụ ike.—Hib. 10:24, 25.

6 Inweta afọ ojuju na-enye ọṅụ ná ndụ na inwe mmasị n’ọdịmma ndị ọzọ, nwere njikọ kpọmkwem. A na-agba anyị ume ịchọ ụzọ isi tụnye ụtụ n’obi ụtọ nke ndị ọzọ. N’ihi ya, nzukọ ndị Kraịst anyị bụ n’ezie maka abamuru onwe anyị na maka abamuru nke ndị anyị so na-enwe mkpakọrịta na-ewuli elu. Ihe a chọrọ n’aka anyị bụ iji obi anyị na-ekere òkè.

7 Pọl onyeozi kwuru ihe yiri nke ahụ na ndụmọdụ o nyere Timoti mgbe o dere, sị: “[Na-azụ] onwe gị ka i wee ruo nsọpụrụ Chineke.” (1 Tim. 4:7) Anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, sị: ‘Àna m azụ onwe m? Àna m amụta irite uru site n’ihe m na-anụ ná nzukọ ọgbakọ?’ Azịza anyị ga-abụ ee ma ọ bụrụ na anyị na-aṅa ntị n’ihe anyị na-anụ ná nzukọ ma na-agbalị itinye ihe anyị na-amụta n’ọrụ. N’anya nke okwukwe, anyị aghaghị inwe ike ile anya gabiga ụmụnna na-akụzi ihe ndị ahụ ma hụ Jehova dị ka Onye Nkụzi Ukwu nke ndị ya.—Aịsa. 30:20.

8 Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na Nzukọ Ije Ozi: A haziri nzukọ abụọ a iji nyere anyị aka ịdị irè n’ozi ndị Kraịst. Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke bụ nnọọ maka nke ahụ—ụlọ akwụkwọ nke nwere ụmụ akwụkwọ ndị na-enweta ntụziaka na ndụmọdụ mgbe nile. I nwere ohere nke igosipụta ọganihu gị dị ka ọkà okwu ihu ọha na dị ka onye nkụzi nke Okwu Chineke. Ma iji rite uru kasị ukwuu n’ụlọ akwụkwọ ahụ, ị ghaghị idebanye aha gị, na-agachi anya, na-ekerechi òkè anya, ma na-etinye uche n’ihe omume gị. Ịnakwere na itinye ndụmọdụ a na-enye n’ọrụ ga-enyere gị aka inwe ọganihu.

9 Nzukọ Ije Ozi na-akụziri anyị mkpa nke ozi ndị Kraịst dị ma na-egosi anyị otú anyị pụrụ isi kere òkè n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ. Gị na ezinụlọ gị, ùnu na-erite uru n’ụzọ zuru ezu site n’ihe ndị a na-ekwu ná nzukọ abụọ a? Otu di na nwunye bụ́ ndị Kraịst kwuru, sị: “N’otu Nzukọ Ije Ozi, anyị nụrụ na anyị kwesịrị ịdị na-atụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị dị ka ezinụlọ. Anyị adịghị emebu nke a, ma ugbu a anyị na-eme ya.” Olee otú ha siworo rite uru? Ha na-ekweta, sị: “Anyị na-ahụ na mkparịta ụka anyị n’oge nri na-enye ọṅụ karị. Anyị adịghịzi arụ ụka n’oge nri.” Ọbụna ụmụaka ndị dị obere, hà na-erite uru ná nzukọ ndị ahụ? Ee. Nne ha na-ekwu, sị: “O doro anya na nzukọ ndị ahụ na-emetụta ụmụ anyị n’ụzọ miri emi. N’otu izu kpọmkwem, anyị jidere nwa anyị dị afọ isii ka ọ na-agha ụgha. Ma ná nzukọ e nwere n’izu ahụ, okwu izi ihe bụ banyere ịgha ụgha. N’oké obi amamikpe nke pụtara ìhè n’ihu ya, nwa anyị nwoke lere nna ya anya, ihere mekwara ya nke ukwuu. O ruru ya n’ahụ, anyị enweghịkwa nsogbu ọzọ mgbe nke ahụ gasịrị.”

10 Otu nwanna nwanyị bụ́ onye ọsụ ụzọ kwuru na obi dị ya ụtọ na a na-atụ aro maka imeziwanye ozi anyị ná Nzukọ Ije Ozi. N’ihi gịnị? Ọ na-akọwa, sị: “Ọ na-agwụ m ike. Mgbe ụfọdụ ana m eche na aro a na-atụ n’Ozi Alaeze Anyị agaghị adị irè. Ma ná Nzukọ Ije Ozi, mgbe m na-anụ na anyị kwesịrị ịnwale ya, ana m enwe ịnụ ọkụ n’obi dị ukwuu itinye aro ndị ahụ n’ọrụ. Ọ na-eme ka ozi ahụ na-akpali akpali!” Mgbe ọtụtụ izu nke itinye aro nke ịgbalị ịmalite ọmụmụ Bible ná nleta mbụ n’ọrụ gasịrị, ọ maliteere otu nwa agbọghọ, bụ́ onye nọworo na-ekpe ekpere maka enyemaka, ọmụmụ ihe mgbe mbụ ọ kpọtụụrụ ya.

11 Mgbe ị nụrụ okwu na-agụnye ndụmọdụ Bible banyere nhọrọ onwe onye ndị ị na-eme, ị̀ na-enwe mmetụta na Jehova na-agwa gị okwu kpọmkwem? Otu nwanna nwoke nwere mmetụta dị otú ahụ. O kwuru, sị: “N’otu nzukọ e nwere na nso nso a, e nwere okwu otu nwanna nwoke kwuru bụ́ nke ọ tụlere ụdị ntụrụndụ kwesịịrị ndị Kraịst na ndị na-ekwesịrịghị ha na ya. M na-enwebu mmasị ikiri ndị na-eti ọkpọ na telivishọn. Ma mgbe nzukọ ahụ gasịrị, ekpebiri m na egwuregwu a so n’ụdị ntụrụndụ na-agaghị ekwesịrị ndị Kraịst. N’ihi ya, adịghịzi m ekiri ya.” Ee, ọ bụ ezie na nwanna nwoke a azụlitewo mmasị n’ikiri ihe ike, o ji ịdị umeala n’obi nakwere nduzi Jehova.—Abụ Ọma 11:5.

12 Nzukọ Ihu Ọha, Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, na Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ: Okwu ihu ọha anyị na-anụ kwa izu na-atụle isiokwu dị iche iche nke Bible. Olee uru ị na-erite n’okwu ndị a? Otu onye Kraịst bụ́ di kwuru okwu banyere uru ndị o riteworo, sị: “Otu okwu ihu ọha kọwapụtara mkpụrụ nile nke mmụọ nsọ. Ọkà okwu kwuru banyere onwe ya, na iji rụọ ọrụ n’ịzụlite mkpụrụ ndị a, na ya na-ahọrọ otu àgwà n’otu izu ma rụọ ọrụ na nke ahụ ruo otu izu. Mgbe izu ahụ gwụsịrị, ọ na-atụgharị uche n’otú o meruru nke ọma n’igosipụta mkpụrụ ahụ n’ihe omume ya kwa ụbọchị. Mgbe ahụ, ọ na-arụ ọrụ n’àgwà ọzọ n’izu ọzọ. Echiche ahụ masịrị m, amalitekwara m ime nke ahụ n’onwe m.” Lee ụzọ dị mma nke isi tinye ihe a mụtara n’ọrụ ọ bụ!

13 Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche na-akụziri anyị ka anyị tinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ n’ọnọdụ dị iche iche ná ndụ. Nke a na-enyere anyị aka ịnọgide na-enwe uche na obi iru ala n’agbanyeghị nchegbu nke ndụ. Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche na-emekwa ka anyị mara ihe ndị kasị ọhụrụ banyere eziokwu ahụ nke na-aga n’ihu n’ihu. Dị ka ihe atụ, ọ̀ bụ na anyị eriteghị uru site n’ịmụ isiokwu ndị dị n’Ụlọ Nche nke May 1, 1999, ndị a kpọrọ: “Ihe Ndị A Aghaghị Ịpụta,” “Onye Na-agụ, Ya Tụgharịa Uche,” na “Nọrọ na Nche ma Dị Uchu!” Olee otú ọmụmụ ihe ndị a si metụta gị? Ị̀ na-egosi site n’omume gị na i bu ịdọ aka ná ntị Jisọs nyere banyere ọdịnihu n’obi? Ị̀ na-akwadebe onwe gị maka ule ndị dị n’ihu mgbe anyị ga-ahụ “ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu . . . ka ọ na-eguzo n’ebe nsọ”? (Mat. 24:15-22) Ihe mgbaru ọsọ gị na ụzọ ndụ gị, hà na-egosi na ọ bụghị ịkwakọba ihe onwunwe, kama ido aha Jehova nsọ bụ ihe kasị mkpa nye gị? N’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, ọ̀ bụ na anyị adịghị amụta irite uru n’onwe anyị ugbu a?

14 Cheedị banyere ihe dị ukwuu ndị anyị na-amụta n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ kwa izu. Anyị na-amụ akwụkwọ Bible bụ́ Daniel ugbu a. N’ime ọnwa anọ anyị nọworo na-amụ akwụkwọ Bible ahụ, ọ̀ bụ na anyị ahụbeghị ka okwukwe anyị na-eto kwa izu? Dị ka onye amụma Jehova hụrụ n’anya bụ́ Daniel, anyị na-ewusi okwukwe anyị ike ka anyị wee nwee ike ịtachi obi.

15 Jehova Na-akụziri Anyị Ịdị Ndụ Na-enye Ọṅụ: Anyị na-ezere inwe oké mwute mgbe anyị ṅara ntị n’iwu Chineke. Ọzọkwa, anyị na-ahụ ihe ịdị ndụ na-enye ọṅụ pụtara. Site n’ịgbaso idu ndú Jehova, anyị na-aghọ ndị na-ekere òkè n’ọrụ ya, ọ bụghị ndị na-ele nanị anya. Ndị na-arụkwa ọrụ Chineke bụ ndị nwere obi ụtọ.—1 Kọr. 3:9; Jes. 1:25.

16 Chesie echiche ike banyere otú ị ga-esi tinye ihe ndị ị na-anụ ná nzukọ ọgbakọ n’ọrụ. (Jọn 13:17) Jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Chineke ozi, site n’obi gị dum. Ọṅụ gị ga-amụba. Ndụ gị ga-adị mma karị, nwekwuo nzube. Ee, ị ga na-erite uru.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya