ISI NKE 7
Nzukọ Ndị ‘Na-akpali Anyị Inwe Ịhụnanya na Ịrụ Ezi Ọrụ’
KEMGBE ụwa, ndị na-efe Jehova na-enwe nzukọ a haziri ahazi. N’oge ochie, ụmụ nwoke ndị Izrel na-aga Jeruselem ugboro atọ n’afọ maka ememme atọ ha na-eme. (Diut. 16:16) N’oge ndịozi, Ndị Kraịst na-ezukọ ugboro ugboro. Ha na-anọkarịkwa n’ụlọ ndị mmadụ enwe nzukọ ndị ahụ. (Faị. 1, 2) Taa, anyị na-enwe ọmụmụ ihe, na-agakwa mgbakọ sekit na mgbakọ ukwu. Gịnị mere ndị na-efe Chineke ji ezukọta ọnụ? Ọ bụ n’ihi na ọ bụ otu n’ime ụzọ ha si efe Chineke.—Ọma 95:6; Kọl. 3:16.
2 Nzukọ ndị a na-abara ndị na-abịa ha uru. Baịbụl kwuru ihe ndị Izrel ga-eme n’oge Ememme Ụlọ Ndò nke asaa ọ bụla. Ọ sịrị: “Kpọkọta ụmụ Izrel, ndị ikom na ndị inyom na ụmụntakịrị na onye mbịarambịa nke nọ n’ime obodo gị, ka ha wee gee ntị, ka ha mụtakwa ihe, ka ha tụọ egwu Jehova bụ́ Chineke unu ma lezie anya idebe ihe niile e kwuru n’iwu a.” (Diut. 31:12) O doro anya na ihe dị mkpa mere ndị na-efe Chineke ji ezukọta ọnụ bụ ka ‘Jehova kụziere ha ihe.’ (Aịza. 54:13) Nzukọ ndị anyị na-enwe na-eme ka anyị na-amata ibe anyị nakwa ka anyị na-agba ibe anyị ume. Ha na-emekwa ka okwukwe anyị sikwuo ike.
ỌMỤMỤ IHE
3 Mgbe e mechara ememme Pentikọst afọ 33, ndị na-eso ụzọ Jizọs zukọtara na-ege ntị n’ihe ndịozi na-akụzi ma ‘jiri otu obi na-anọ mgbe niile n’ụlọ nsọ kwa ụbọchị.’ (Ọrụ 2:42, 46) Ka oge na-aga, ọ na-abụ ha zukọta ife Chineke, ha agụọ amaokwu Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ, gụọkwa akwụkwọ ozi ndịozi dere nakwa nke Ndị Kraịst ndị ọzọ dere. (1 Kọr. 1:1, 2; Kọl. 4:16; 1 Tesa. 1:1; Jems 1:1) Ha na-ekpekwa ekpere ná nzukọ ndị ahụ. (Ọrụ 4:24-29; 20:36) Mgbe ụfọdụ, ndị ozi ala ọzọ n’oge ahụ na-akọkwa otú Chineke si na-enyere ha aka n’ozi ha. (Ọrụ 11:5-18; 14:27, 28) Ihe Baịbụl na-akụzi na otú amụma ndị dị na ya si emezu sokwa n’ihe ndị ha na-amụ. A kụzikwaara ha ụdị àgwà Ndị Kraịst kwesịrị ịna-akpa nakwa otú ha kwesịrị isi na-efe Chineke. A gbakwara ha niile ume ka ha na-ekwusasi ozi ọma ike.—Rom 10:9, 10; 1 Kọr. 11:23-26; 15:58; Efe. 5:1-33.
N’oge ikpeazụ a tara ezigbo akpụ, anyị kwesịrị ịna-abịachi ọmụmụ ihe anya ka a na-agba anyị ume
4 N’oge anyị a, anyị na-enwekwa ụdị nzukọ ahụ Ndị Kraịst nwere n’oge ndịozi. Anyị na-eme ihe e kwuru ná Ndị Hibru 10:24, 25. Ebe ahụ sịrị: “Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche . . . , ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị, dị ka ụfọdụ ndị na-emekarị, kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa otú ahụ karị, ka unu na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.” N’oge ikpeazụ a tara ezigbo akpụ, anyị kwesịrị ịna-abịachi ọmụmụ ihe anya ka a na-agba anyị ume n’ihi na ọ ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike, meekwa ka anyị nọgide na-efe Chineke. (Rom 1:11, 12) Anyị bi n’etiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ, nke hịgọkwara ahịgọ. Anyị ajụkwala àgwà ndị Chineke kpọrọ asị nakwa ọchịchọ nke ụwa. (Fil. 2:15, 16; Taị. 2:12-14) Ebe ọ dị otú a, anyị kwesịrị ịna-aga ọmụmụ ihe ka anyị na ụmụnna anyị na-efekọ Jehova ọnụ. (Ọma 84:10) O nweghị ihe ga-abara anyị uru karịa Okwu Chineke a na-akụziri anyị n’ọmụmụ ihe. Ugbu a, ka anyị leba anya n’ọmụmụ ihe ndị anyị na-enwe na uru ha na-abara anyị.
ỌMỤMỤ IHE NGWỤCHA IZU
5 Ọmụmụ ihe mbụ a na-enwe ná ngwụsị izu bụ okwu ihu ọha. Ihe a na-ekwu n’okwu ihu ọha bụ isiokwu si na Baịbụl. Ọ bụ ọhaneze ka a na-aka ebu n’obi ekwu okwu a. Ụfọdụ n’ime ha abịatụbeghị ọmụmụ ihe anyị. E ji okwu ihu ọha akụziri ndị nkwusa nọ n’ọgbakọ ma ndị ọhụrụ bịara ọmụmụ ihe anyị Okwu Chineke.—Ọrụ 18:4; 19:9, 10.
6 Jizọs Kraịst, ndịozi ya, na ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ kwuru okwu ihu ọha. Taa, Ndịàmà Jehova na-ekwukwa okwu ihu ọha n’ọgbakọ ha dị iche iche. Ma, o doro anya na o nweghị onye a ga-eji tụnyere Jizọs ma a bịa n’ikwu okwu ihu ọha. Ọ bụ ya mere ndị mmadụ ji kwuo banyere ya, sị: “Ọ dịtụbeghị onye ọzọ si otú a kwuo okwu.” (Jọn 7:46) Jizọs kwuru okwu ka onye nwere ikike, ihe o kwuru jukwara ndị mmadụ anya. (Mat. 7:28, 29) Okwu ya baara ndị chebaara ya echiche ezigbo uru. (Mat. 13:16, 17) Ndịozi Jizọs kwukwara okwu nke ọma ka Jizọs. Ihe e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 2:14-36 gosiri na Pita kwuru okwu ruru ndị mmadụ n’obi na Pentikọst afọ 33. Ihe o kwuru mere ka ọtụtụ puku mmadụ gere ya ntị bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Pọl gwakwara ndị mmadụ okwu n’Atens, ụfọdụ aghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.—Ọrụ 17:22-34.
7 N’oge anyị a, Ndịàmà Jehova na-ekwukwa okwu ihu ọha n’ọgbakọ ha dị iche iche kwa izu, nakwa ná mgbakọ sekit na mgbakọ ukwu ha na-enwe. Okwu ndị a abaakwarala ọtụtụ nde mmadụ uru. Ha na-enyere anyị aka ịmụta eziokwu ndị dị na Baịbụl, na-emekwa ka anyị nọgidesie ike n’ozi Jehova. Anyị kwesịrị ịna-akpọ ndị nwere mmasị nakwa ọhaneze ka ha bịa gere okwu ihu ọha ndị a n’ihi na ọ ga-eme ka ha mụta ihe Baịbụl na-akụzi.
8 Okwu ihu ọha na-enwe isiokwu dị iche iche. Ụfọdụ n’ime ha na-ekwu banyere ihe Baịbụl na-akụzi, amụma ndị dị na Baịbụl, otú e nwere ike isi na-ebi ndụ n’ezinụlọ nakwa ihe gbasara di na nwunye. E nwere ndị nke na-ekwu gbasara ihe ha na ndị na-eto eto na-alụ, otú Ndị Kraịst kwesịrị isi na-akpa àgwà nakwa ihe ndị dị ebube Jehova kere. E nwekwara ndị nke na-ekwu gbasara otú ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl si nwee okwukwe na obi ike, otú ha si fee Chineke nke ọma nakwa ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’aka ha.
9 Anyị kwesịrị ige ntị nke ọma mgbe a na-ekwu okwu ihu ọha ka anyị nwee ike ịmụta ihe. Onye na-ekwu okwu ahụ kpọọ ebe ọ chọrọ ịgụ na Baịbụl, anyị asapeta ya, lewe anya mgbe ọ na-agụ ya ma hụ otú o si kọwaa ya. (Luk 8:18) Anyị ghọta ihe e kwuru, anyị ga-agbalị ka anyị ghara ichefu ya ma mee ihe ndị anyị mụtara.—1 Tesa. 5:21.
10 Ọ bụrụ na e nwere ụmụnna na-ekwu okwu ihu ọha n’ọgbakọ, a ga na-ekwu ya kwa izu. Ihe na-enyekarịrị ọgbakọ aka ịna-ekwu okwu ihu ọha kwa izu bụ ịgwa ụmụnna na-ekwu okwu ihu ọha n’ọgbakọ ndị dị ha nso ka ha bịa kwuoro ha okwu ihu ọha. Ọ bụrụ na ndị na-ekwu okwu ihu ọha n’ọgbakọ ebughị ibu, e nwere ike ikwu ya mgbe ọ bụla o kwere omume.
11 Ọmụmụ ihe nke abụọ anyị na-enwe ná ngwụcha izu bụ Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Ọ na-abụ ajụjụ na azịza. A na-eji isiokwu ụfọdụ dị n’Ụlọ Nche a na-amụ amụ eduzi ya. Jehova na-eji Ụlọ Nche akụziri anyị ihe n’oge kwesịrị ekwesị.
12 Isiokwu ndị anyị na-amụ amụ n’Ụlọ Nche na-akọwara anyị otú anyị nwere ike isi na-eme ihe Baịbụl kwuru. Ha na-emekwa ka a ghara inwe ihe jikọrọ anyị na “mmụọ nke ụwa” nakwa omume rụrụ arụ. (1 Kọr. 2:12) A na-esi n’Ụlọ Nche akọwakwuru anyị ihe Baịbụl na-akụzi na amụma ndị dị na ya. Nke a na-eme ka anyị na-amata ihe nzukọ Jehova na-akụziri anyị ugbu a, meekwa ka anyị nọrọ n’ụzọ nke ndị ezi omume. (Ọma 97:11; Ilu 4:18) Ịnọ n’ọmụmụ ihe mgbe a na-amụ Ụlọ Nche ma na-aza ajụjụ ga-eme ka anyị na-aṅụrị ọṅụ n’olileanya anyị nwere maka ụwa ọhụrụ Jehova kwere anyị ná nkwa. (Rom 12:12; 2 Pita 3:13) Ọmụmụ ihe Ụlọ Nche na-enyere anyị aka ịkpa àgwà ndị e ji ama ndị nwere mmụọ nsọ Chineke. Ọ na-emekwa ka anyị na-anụkwu ọkụ n’obi n’ozi Jehova. (Gal. 5:22, 23) Ihe ọzọ bụ na ọ na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike idi nsogbu ndị na-abịara anyị. Ọ na-emekwa ka anyị na-atọrọ ‘onwe anyị ezi ntọala maka ọdịnihu’ ka anyị nwee ike ‘ijidesi aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.’—1 Tim. 6:19; 1 Pita 1:6, 7.
13 Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịmụta ihe n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche? Onye ọ bula n’ime anyị kwesịrị ịmụ isiokwu a ga-amụ tupu ya agawa ọmụmụ ihe, gụọkwa amaokwu Baịbụl ndị dị na ya. Anyị na ndị ezinụlọ anyị nwekwara ike ịmụkọta ya ọnụ. Anyị zawa ajụjụ, anyị kwesịrị ikwu ihe anyị ghọtara kama ịgụpụta ihe dị na paragraf. Ime otú ahụ ga-eme ka ihe ndị ahụ anyị zara ruo anyị n’obi, meekwa ka ụmụnna anyị mụta ihe na ya. Ọ bụrụ na anyị egee ụmụnna anyị ntị nke ọma mgbe ha na-aza ajụjụ, anyị ga-amụta ihe kwa izu n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche.
ỌMỤMỤ IHE ETITI IZU
14 N’izu ọ bụla, ọgbakọ na-abịakọta ọnụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze maka ọmụmụ ihe anyị a na-akpọ Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ. Ọmụmụ ihe a nwere agba atọ. Ha na-eme ka anyị “ruo eru nke ọma” ịbụ ndị ozi Chineke. (2 Kọr. 3:5, 6) Ihe ndị a ga-amụ na ha na-agba n’ọnwa ọ bụla n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ. Ihe ọzọ na-agba na ya nke na-enyere anyị aka izi ozi ọma bụ ihe gị na mmadụ nwere ike ikwurịta.
15 Agba nke mbụ n’ọmụmụ ihe anyị a bụ Akụ̀ Ndị Si n’Okwu Chineke. Ọ na-enyere anyị aka ịmatakwu akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl na otú anyị ga-esi eme ihe anyị mụtara na ha. A na-enwe okwu, ọgụgụ Baịbụl, na ihe omume ndị na-ege ntị ga-ekwu ihe ha mụtara n’ọgụgụ Baịbụl izu ahụ. Ihe osise ndị ga-eme ka ihe ndị a kọrọ na Baịbụl dokwuo anyị anya, na ebe a ga-ede ihe na-adịkwa n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ. Isi otú a amụ Baịbụl na-abara anyị uru ná ndụ anyị, na-enyekwara anyị aka ịkụziri ndị ọzọ ihe nke ọma. Ọ na-eme ka anyị ‘ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ ndị a kwadebere n’ụzọ zuru ezu ịrụ ezi ọrụ niile.’—2 Tim. 3:16, 17.
16 Agba nke abụọ bụ Mụtakwuo Izi Ozi Ọma nke Ọma. Ọ na-enyere anyị niile aka ịmatakwu otú anyị ga-esi na-ezi ozi ọma ma na-akụzi ihe nke ọma. A na-enwe ihe omume ụmụ akwụkwọ, na-elekwa vidio ndị na-egosi ihe gị na mmadụ nwere ike ikwurịta. Ọmụmụ ihe a na-enyere anyị aka inwe “ire nke ndị a kụziiri ihe” ka anyị wee ‘mata otú anyị ga-esi zaa onye ike gwụrụ okwu.’—Aịza. 50:4.
17 Agba nke atọ bụ Otú Ndị Kraịst Si Ebi Ndụ. Ihe anyị na-amụ na ya bụ otú anyị ga-esi na-eme ihe Baịbụl kwuru ná ndụ anyị kwa ụbọchị. (Ọma 119:105) Ihe bụ́ isi a na-eme na ya bụ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ. A na-amụ ya ka Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, ya bụ, n’ụdị ajụjụ na azịza.
18 N’ọnwa ọ bụla, mgbe ọgbakọ nwetara Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ, onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ ma ọ bụ okenye na-enyere ya aka ga-eji nwayọọ gụọ ya ma kenye ụmụnna nke ha ga-eme. Ndị okenye na-ahọpụta okenye ma otu esi ezi ihe nke ọma ka ọ bụrụ onyeisi oche ọmụmụ ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ n’izu ọ bụla. Ihe so n’ọrụ ya bụ ịmalite ọmụmụ ihe a n’oge, hụkwa na a gbasara n’oge. Ọ ga-aja ụmụ akwụkwọ ndị mere ihe omume mma, gwakwa ha ebe ha ga-emekwu nke ọma.
19 Ọ bụrụ na anyị ana-akwadebe maka ọmụmụ ihe anyị a bụ́ Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ, na-abịachi ya anya, ma soro na-eme ihe ndị a na-eme na ya, anyị ga-ama Baịbụl, ghọtakwuo ụkpụrụ ndị dị́ na Baịbụl, obi esiekwa anyị ike ịna-ezi ozi ọma, anyị amụtakwuokwa otú anyị ga-esi na-eme ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Mkpakọrịta anyị na ụmụnna anyị na ihe ndị a na-amụ n’ọmụmụ ihe a na-abakwara ndị a na-emebeghị baptizim na-abịa ya uru. Anyị nwere ike ịga na JW Library®, n’Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N’ỊNTANET ma ọ bụ nke dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze kwadebe ọmụmụ ihe a ma ọ bụ ọmụmụ ihe anyị ndị ọzọ. Ihe na-adị n’ọ́bá akwụkwọ anyị nke dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ akwụkwọ anyị dị iche iche, Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ, ma ọ bụ Watch Tower Publications Index, nsụgharị Baịbụl dị iche iche, akwụkwọ ọkọwa okwu, na ọtụtụ akwụkwọ ndị ọzọ e nwere ike iji mee nchọnchọ. Onye ọ bụla nwere ike ịchọ ihe n’ọ́bá akwụkwọ a tupu ọmụmụ ihe ebido ma ọ bụ mgbe a gbasara ọmụmụ ihe.
NZUKỌ OZI UBI
20 Ọgbakọ na-enwe nzukọ ozi ubi n’oge dị iche iche n’ime izu ma ọ bụ ná ngwụcha izu maka ndị nkwusa chọrọ ịga ozi ọma. Nzukọ a anaghịkwa egbu oge. A na-anọkarị n’ụlọ ụmụnna enwe ya ma ọ bụ n’ebe ndị ọzọ ga-adịrị ụmụnna mfe. E nwekwara ike inwe ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụrụ na ìgwè ozi ubi ọ bụla ana-enwe nzukọ ozi ubi n’ókèala ha, o nwere ike ime ka ọ dịrị ndị nkwusa mfe ịgaru ebe a ga-anọ enwe nzukọ a. Ọ ga-emekwa ka a hazie ndị bịara ozi ọma ngwa ngwa, ha agawakwa ebe ha ga-arụ n’egbughị oge. Ihe ọzọkwa bụ na ọ ga-eme ka nwanna na-elekọta ìgwè ozi ubi nke ọ bụla na-elebara ndị nọ n’ìgwè ya anya nke ọma. Ọ bụ eziokwu na ọ dị mma ka ìgwè ozi ubi na-enwe nzukọ ozi ubi nke ha iche, ma e nwere ihe ndị nwere ike ime ka ìgwè ụfọdụ nọkọta ọnụ nwee nzukọ a. Dị ka ihe atụ, n’etiti izu, mgbe ụmụnna ole na ole na-apụta ozi ọma, o nwere ike ịka mma ka ìgwè ozi ubi dị iche iche ma ọ bụkwanụ ọgbakọ bịakọta ọnụ nwee nzukọ ozi ubi n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ n’ebe ọzọ dị ha mma. Ọ ga-eme ka ụmụnna pụtara ozi ọma nwee ndị ha na ha ga-arụ. Ọgbakọ nwekwara ike ịbịakọta ọnụ nwee nzukọ ozi ubi n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ụbọchị ndị ụwa na-eme ememme ha. Ha nwekwara ike inwe ya ma e mechie Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche.
21 Ọ bụrụ na ìgwè ozi ubi ọ bụla enwee nzukọ ozi ubi nke ya, ọ bụ onye nlekọta ìgwè ahụ ga-eduzi ya. Mgbe ụfọdụ, onye nlekọta ìgwè nwere ike ịgwa onye na-enyere ya aka ma ọ bụ nwanna ọzọ ruru eru ka o duzie ya. Onye ga-eduzi nzukọ a ga-agwa ụmụnna ihe ndị ga-enyere ha aka n’ozi ọma. O kwuchaa, ya ekenye ụmụnna ndị ha na ha ga-arụ, gwazie otu nwanna nwoke ka o mechie n’ekpere. O kpechaa, ụmụnna agawazie ebe ha ga-arụ ozugbo. Nzukọ a kwesịrị iwe nkeji ise ruo nkeji asaa, ma ọ gaghị eru otú ahụ ma ọ bụrụ na a ga-enwe ya ma a gbasaa ọmụmụ ihe. E kwesịrị ịgba ndị bịara ya ume, kọọrọ ha ihe ndị ga-enyere ha aka n’ozi ọma nakwa otú ha nwere ike isi zie ozi ọma. E nwere ike ikenye ndị nkwusa ọhụrụ ma ọ bụ ụmụnna ndị e nwere ike inyere aka ka ha na ụmụnna ndị jeerela Jehova ozi ọtụtụ afọ rụọ, ka ụmụnna ndị a nwee ike inyere ha aka.
OTÚ ỌGBAKỌ NDỊ ỌHỤRỤ MA Ọ BỤ NDỊ NA-EBUGHỊ IBU GA-ESI NA-ENWE ỌMỤMỤ IHE
22 Ka ọtụtụ ndị na-abata n’ọgbakọ, a na-enwekwu ọgbakọ ndị ọhụrụ. Ọ na-abụkarị onye nlekọta sekit na-ezitere alaka ụlọ ọrụ fọm ndị e dejupụtara maka ọgbakọ a chọrọ ihiwe. Mgbe ụfọdụ, ụmụnna ndị bi n’ebe a na-enweghị ọgbakọ nwere ike iso ọgbakọ kacha dịrị ha nso na-amụ ihe.
23 Mgbe ụfọdụ, e nwere ike inwe naanị ụmụnna nwaanyị n’ọgbakọ ndị na-ebughị ibu. N’ọgbakọ dị otú ahụ, nwanna nwaanyị kpewe ekpere ma ọ bụ duziwe ọmụmụ ihe, ọ ga-ekechi isi ya ekechi n’ihi na ọ bụ ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. (1 Kọr. 11:3-16) Ọ ga-anọ ọdụ ma chee ndị ọ na-agwa okwu ihu. Ụmụnna nwaanyị anaghị eguzo ọtọ n’ikpo okwu agwa ọgbakọ okwu otú ụmụnna nwoke si eme. N’ihi ya, ha duziwe ọmụmụ ihe n’ọgbakọ mgbe ụmụnna nwoke na-anọghị ya, ha ga-agụpụta ihe a na-amụ agụpụta ma kwuo ihe ndị ha ghọtara na ya. Ha nwekwara ike ime ya ka mkparịta ụka ma ọ bụ ihe ngosi. Alaka ụlọ ọrụ ga-agwa otu n’ime ha ka ọ na-ahụ maka akwụkwọ ozi a na-ezigara alaka ụlọ ọrụ na nke alaka ụlọ ọrụ na-ezite, na-eduzikwa ọmụmụ ihe. Ọ bụrụ na e mechaa nwee ụmụnna nwoke ruru eru ịbụ ndị ohu na-eje ozi ma ọ bụ ndị okenye, ha ga-arụwazi ọrụ ndị ahụ.
MGBAKỌ SEKIT
24 Ugboro abụọ n’afọ ọ bụla, ọgbakọ niile nọ n’otu sekit na-enwe mgbakọ sekit na-ewe otu ụbọchị. Mgbakọ ndị a na-atọ ụmụnna ụtọ, na-emekwa ka ha ‘meghee obi’ ha ka ha na ibe ha na-akparịta. (2 Kọr. 6:11-13) Nzukọ Jehova na-eburu mkpa e nwere n’obi akwadebe isiokwu mgbakọ sekit ndị a nakwa okwu ndị a ga-ekwu na ha. Isiokwu ndị a na-esi na Baịbụl. Ná mgbakọ ndị a, a na-enwe okwu ndị a na-ekwu, ihe ngosi, ajụjụ ọnụ nakwa ebe mmadụ na-agwa onwe ya okwu. A na-eji ihe ndị a eme ka okwukwe ndị niile bịara mgbakọ sikwuo ike. A na-emekwa ndị mmadụ baptizim iji gosi na ha enyefeela Jehova onwe ha.
MGBAKỌ UKWU
25 A na-enwe mgbakọ ukwu otu ugboro n’afọ. Mgbakọ a na-ewekarị abalị atọ. A na-esi na sekit dị iche iche enweta ọgbakọ ndị ga-abịa ya. Alaka ụlọ ọrụ ndị na-enweghị ọtụtụ ọgbakọ ha na-elekọta nwere ike ịgwa ọgbakọ ndị ahụ ka ha nwekọta mgbakọ a ọnụ. Ná mba ụfọdụ, otú e si ahazi mgbakọ ukwu nwere ike ịdị iche n’otú e si ahazi ya ná mba ndị ọzọ. Ihe nwere ike ịkpata ya bụ ihe nzukọ Jehova kwuru ma ọ bụ otú ihe si dị ná mba ndị a. Mgbe ụfọdụ, a na-enwekwa mgbakọ mba niile ma ọ bụ mgbakọ pụrụ iche ná mba ụfọdụ. Ọtụtụ puku Ndịàmà Jehova na-esi ná mba dị iche iche abịa ya. Kemgbe ọtụtụ afọ, ọtụtụ ndị anụla ozi ọma Alaeze Chineke n’ihi otú anyị si akpọ ọhaneze ka ha bịa mgbakọ ukwu ndị anyị na-enwe.
26 Mgbakọ ukwu na-atọgbu Ndịàmà Jehova atọgbu n’ihi na ọ bụ otu ụzọ ha si efekọ Jehova ọnụ. A na-anọ na ya eme ka anyị ghọtakwuo eziokwu ndị dị na Baịbụl. Ná mgbakọ ukwu ụfọdụ, a na-ewepụta akwụkwọ ndị ọhụrụ a ga-amụ n’ọgbakọ, nke mmadụ ga-agụ n’onwe ya ma ọ bụ nke a ga-eji gaa ozi ọma. A na-emekwa ndị ruru eru baptizim. Mgbakọ ukwu dị anyị ezigbo mkpa n’ihi na ọ na-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike. Ọ na-egosikwa na Ndịàmà Jehova bụ otu n’ụwa niile nakwa na ha hụrụ ibe ha n’anya, nke bụ́ ihe e ji ama ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst.—Jọn 13:35.
27 Ọ bụrụ na anyị ana-aga ọmụmụ ihe, mgbakọ sekit, na mgbakọ ukwu, ọ ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike ime uche Jehova. Ihe ndị anyị na-amụta na ha na-eme ka anyị ghara ịkpa àgwà ka ndị ụwa n’ihi na ịkpa àgwà ka ha ga-emebi okwukwe anyị. Ọmụmụ ihe na mgbakọ anyị ndị a na-eme ka e too Jehova. (Ọma 35:18; Ilu 14:28) Anyị kwesịrị ịna-ekele Jehova n’ihi na ọ haziri nzukọ ndị a na-eme ka obi na-eru anyị ala n’oge ikpeazụ a.
NRI ANYASỊ NKE ONYENWE ANYỊ
28 Ọgbakọ Ndịàmà Jehova n’ụwa niile na-echeta ọnwụ Jizọs Kraịst otu ugboro n’afọ n’ụbọchị ahụ ọ nwụrụ. A na-akpọ ya Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. (1 Kọr. 11:20, 23, 24) Nzukọ a bụ nzukọ kacha mkpa anyị na-enwe n’afọ. Ọ bụ Jizọs gwara anyị ka anyị na-enwe ya.—Luk 22:19.
29 Ụbọchị a na-echeta ọnwụ Jizọs na-adaba n’ụbọchị Baịbụl kwuru ndị Juu ji eme Ememme Ngabiga. (Ọpụ. 12:2, 6; Mat. 26:17, 20, 26) Ememme Ngabiga bụ ememme ndị Izrel na-eme kwa afọ. Ha ji ya echeta mgbe Chineke kpọpụtara ha n’Ijipt n’afọ 1513 Tupu Oge Ndị Kraịst. N’oge ahụ, Jehova gwara ha rie nwa atụrụ Ememme Ngabiga n’abalị iri na anọ n’ọnwa mbụ ha. Ọ bụkwa ya bụ ụbọchị ọ gwara ha si n’Ijipt ha nọ na-agba ohu pụọ. (Ọpụ. 12:1-51) Otú e si ama oge a ga-eme ya bụ ịgụ ụbọchị iri na atọ malite mgbe ọnwa ọhụrụ pụtara na Jeruselem. Ọnwa ọhụrụ a na-apụta n’ihe dị ka ụbọchị ehihie na abalị na-aha nhata n’oge opupu ihe ubi. Oge anyị ji echeta ọnwụ Jizọs kwa afọ na-adaba n’oge a n’ụbọchị mbụ ọnwa gbazuru agbazu.
30 Na Matiu 26:26-28, Jizọs kwuru otú anyị ga-esi na-echeta ọnwụ ya. Ihe ndị e ji echeta ọnwụ Jizọs bụ achịcha na mmanya nkịtị nke nọchiri anya ahụ́ ya na ọbara ya. Ọ bụ Ndị Kraịst ha na Jizọs ga-eso achị n’Alaeze eluigwe na-ata achịcha ahụ ma na-aṅụ mmanya ahụ. (Luk 22:28-30) A na-agbakwa mmadụ niile ume, ma Ndị Kraịst ndị ọzọ ma ndị a na-amụrụ Baịbụl, ka ha bịa soro cheta ọnwụ Jizọs. Ma, ha agaghị eso ata achịcha ahụ ma ọ bụ ṅụọ mmanya ahụ. Ọbịbịa ha na-egosi na obi dị ha ụtọ na Jehova Chineke zitere Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst ka ọ nwụọ n’ihi ụmụ mmadụ. Tupu e cheta ọnwụ Jizọs, a na-ekwu okwu ihu ọha pụrụ iche nke e ji eme ka ndị mmadụ nwekwuo mmasị ná Ncheta Ọnwụ Jizọs nakwa n’ịmụ Baịbụl.
31 Ndịàmà Jehova na-atụsi anya ike ka oge ha ji enwe ọmụmụ ihe na nzukọ ruwe eruwe n’ihi na ha na-eme ka ha ‘na-echebara ibe ha echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.’ (Hib. 10:24) Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, na-asa anya ná mmiri akwadebe ọmụmụ ihe na nzukọ ndị a ka anyị nwee ike ịmụta ihe ga-enyere anyị aka ife Jehova nke ọma. A na-agba anyị niile ume nakwa ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ka anyị na-agachi ha anya. Ọ bụrụ na anyị ejiri ihe Jehova na-akụziri anyị ná nzukọ ya kpọrọ ihe, anyị niile ga-adị n’otu. Ọ ga-emekwa ka anyị na-eto Jehova.—Ọma 111:1.