Ezikiel
1 N’abalị ise n’ọnwa anọ n’afọ nke iri atọ,* mgbe mụ na ndị a dọọrọ n’agha bi+ n’akụkụ osimiri Kiba,+ eluigwe meghere, Chineke emee ka m hụwa ọhụụ. 2 N’abalị ise n’ọnwa ahụ, ya bụ, n’afọ nke ise a dọọrọ Eze Jehoyakin n’agha,+ 3 Jehova gwara Ezikiel* nwa Buzaị bụ́ onye nchụàjà okwu n’ala ndị Kaldia,+ n’akụkụ osimiri Kiba. Jehova nyekwara ya ike ebe ahụ.+
4 M hụrụ ka oké ifufe+ si n’ebe ugwu fere na-abịa, hụkwa nnukwu ígwé ojii na ọkụ na-enwu enwu.*+ Ìhè na-egbuke egbuke gbakwara ígwé ojii ahụ gburugburu. Ihe yiri ọla na-egbu maramara* dịkwa n’etiti ọkụ ahụ.+ 5 Ahụrụ m ndị yiri ndị mmụọ ozi anọ*+ n’ime ọkụ ahụ. Nke ọ bụla n’ime ha yiri mmadụ. 6 Nke ọ bụla nwere ihu anọ na nku anọ.+ 7 Ụkwụ ha kwụ nnọọ ọtọ. Ọbụ ụkwụ ha yikwara ọbụ ụkwụ nwa ehi. Ụkwụ ha na-egbukekwa egbuke ka ọla kọpa nke na-egbu maramara.+ 8 Ha nwere aka mmadụ n’okpuru nku nke ọ bụla. Ha anọ nwere ihu, nweekwa nku. 9 Nke ọ bụla n’ime nku ha na-emetụ ibe ya. Ha anọ anaghị atụgharị atụgharị ma ha na-aga. Nke ọ bụla n’ime ha na-aga ihu ihu.+
10 A bịa n’otú ihu ha dị, ha anọ nwere ihu mmadụ, nwee ihu ọdụm+ n’akụkụ aka nri, nweekwa ihu oké ehi+ n’akụkụ aka ekpe. Ha anọ nwekwara ihu+ ugo.+ 11 Otú ahụ ka ihu ha dị. Ha gbasapụkwara nku ha agbasapụ ma chịlie ha elu. Nke ọ bụla nwere nku abụọ na-emetụ ibe ha, abụọ kpuchikwara ahụ́ ha.+
12 Nke ọ bụla n’ime ha na-aga ihu ihu. Ha na-aga ebe ọ bụla mmụọ nsọ chọrọ ka ha gaa.+ Ha anaghị atụgharị atụgharị ma ha na-aga. 13 Ndị mmụọ ozi ahụ* na-acha ọkụ ka icheku ọkụ. Ihe yiri ọwa ọkụ na-enwu enwu na-aga ihu na azụ n’agbata ha. Àmụ̀mà sikwa n’ọkụ ahụ na-egbu.+ 14 Ndị mmụọ ozi ahụ* na-egbu ka àmụ̀mà ka ha na-apụ ma na-alọghachi.
15 Ka m nọ na-ele ndị mmụọ ozi ahụ,* m hụrụ otu wiil dị n’ala n’akụkụ nke ọ bụla n’ime ndị mmụọ ozi ahụ nwere ihu anọ.+ 16 A rụrụ wiil ndị ahụ otú ha na-egbu maramara ka nkume krisolaịt. Ha anọ yiri ibe ha. Otú ha dị dị ka à ga-asị na otu wiil dị n’ime wiil ọzọ.* 17 Ha gawa ebe ha na-aga, ha nwere ike ịga n’akụkụ anọ ha n’atụgharịghị atụgharị ka ha na-aga. 18 Gburugburu elu wiil ndị ahụ dị elu nke na ha na-atụ egwu. Gburugburu elu wiil anọ ahụ bụ anya anya.+ 19 Ebe ọ bụla ndị mmụọ ozi ahụ* na-aga, wiil ndị ahụ na-eso ha. Ọ bụrụ na e si n’ala bulie ndị mmụọ ozi ahụ elu, a na-ebulikwa wiil ndị ahụ.+ 20 Ha na-aga ebe ọ bụla mmụọ nsọ chọrọ ka ha gaa, ya bụ, ebe ọ bụla mmụọ nsọ na-aga. A na-ebuli ha na wiil ndị ahụ elu otu mgbe, n’ihi na mmụọ nsọ nke na-akpa ike n’ahụ́ ndị mmụọ ozi ahụ* dịkwa na wiil ndị ahụ. 21 Ha gawa, wiil ndị ahụ agawa. Ha kwụrụ otu ebe, wiil ndị ahụ akwụrụkwa otu ebe. Ọ bụrụ na e si n’ala bulie ha elu, a na-ebulikọta ha na wiil ndị ahụ, n’ihi na mmụọ nsọ nke na-akpa ike n’ahụ́ ndị mmụọ ozi ahụ* dịkwa na wiil ndị ahụ.
22 N’elu isi ndị mmụọ ozi ahụ, e nwere ihe yiri mbara igwe nke na-egbu maramara ka mkpụrụ mmiri. Ọ dị egwu, gbasaakwa n’elu isi ha.+ 23 Ha gbasara nku ha agbasa n’okpuru mbara igwe ahụ. Otu na-emetụ ibe ya. Nke ọ bụla n’ime ha nwere nku abụọ kpuchiri otu akụkụ ahụ́ ya. Nke ọ bụla nwekwara nku abụọ kpuchiri akụkụ ahụ́ ya nke ọzọ. 24 Mgbe m nụrụ ụda nku ha mgbe ha na-aga, ọ na-ada ka mmiri na-asọsi ike nakwa ka olu Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+ Ha gawa, mkpọtụ ha na-adị ka nke ndị agha. Ha kwụrụ otu ebe, ha na-achịtu nku ha.
25 M nụrụ otu olu n’elu mbara igwe ahụ dị n’elu isi ha. (Mgbe ha kwụ otu ebe, ha na-achịtu nku ha.) 26 N’elu mbara igwe ahụ nke dị n’elu isi ha, e nwere ihe yiri nkume safaya.+ O yikwara ocheeze.+ E nwekwara onye yiri mmadụ nke nọ ọdụ n’elu ihe ahụ yiri ocheeze.+ 27 M hụrụ ihe yiri ọla na-egbu maramara+ ka ọkụ malite n’ihe yiri úkwù ya gbagoo. M hụkwara ihe yiri ọkụ, malite n’ihe yiri úkwù ya gbadaa.+ Ìhè na-enwu gburugburu ya 28 yiri eke na egwurugwu+ nke na-apụta n’ígwé ojii n’ụbọchị mmiri na-ezo. Ọ bụ otú ahụ ka ìhè nke na-enwu gburugburu ya dị. O yiri ebube Jehova.+ Mgbe m hụrụ ya, m gburu ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala. M nụwakwara olu onye na-ekwu okwu.