Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • 1 Ndị Tesalonaịka 2
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ndị Tesalonaịka nke Mbụ

      • Ozi Pọl jere na Tesalonaịka (1-12)

      • Ndị Tesalonaịka nabatara okwu Chineke (13-16)

      • Ọ gụrụ Pọl agụụ ịhụ ndị Tesalonaịka (17-20)

1 Ndị Tesalonaịka 2:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 17:1, 4

1 Ndị Tesalonaịka 2:2

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “ejiri obi ike.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 16:12, 22-24
  • +Ọrụ 17:1, 2

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ịgba Àmà, p. 133

    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi, isi 59

    Ụlọ Nche,

    7/15/2009, p. 20

    7/15/2008, p. 8

    12/15/1999, p. 23-25

1 Ndị Tesalonaịka 2:4

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ilu 17:3; Jer 11:20

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ),

    3/2024, p. 30

1 Ndị Tesalonaịka 2:5

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 20:33

1 Ndị Tesalonaịka 2:6

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Kọ 11:9; 2Te 3:8, 10

1 Ndị Tesalonaịka 2:7

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    11/15/2000, p. 22

1 Ndị Tesalonaịka 2:8

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Grik, “ọ masịrị anyị.”

  • *

    Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jn 15:13
  • +Jn 13:35

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    11/15/2000, p. 22

1 Ndị Tesalonaịka 2:9

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 18:3; 20:34; 2Kọ 11:9; 2Te 3:8, 10

1 Ndị Tesalonaịka 2:11

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 20:31
  • +1Kọ 4:15

1 Ndị Tesalonaịka 2:12

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Efe 4:1; Kọl 1:10; 1Pi 1:15
  • +Lu 22:28-30
  • +1Pi 5:10

1 Ndị Tesalonaịka 2:13

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Te 1:2, 3

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi, isi 5

1 Ndị Tesalonaịka 2:14

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 17:5

1 Ndị Tesalonaịka 2:15

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọrụ 2:22, 23; 7:52
  • +Mt 23:34

1 Ndị Tesalonaịka 2:16

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Lu 11:52; Ọrụ 13:49, 50
  • +Ro 1:18

1 Ndị Tesalonaịka 2:19

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Te 5:23; 2Te 1:4

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

1 Tesa. 2:1Ọrụ 17:1, 4
1 Tesa. 2:2Ọrụ 16:12, 22-24
1 Tesa. 2:2Ọrụ 17:1, 2
1 Tesa. 2:4Ilu 17:3; Jer 11:20
1 Tesa. 2:5Ọrụ 20:33
1 Tesa. 2:62Kọ 11:9; 2Te 3:8, 10
1 Tesa. 2:8Jn 15:13
1 Tesa. 2:8Jn 13:35
1 Tesa. 2:9Ọrụ 18:3; 20:34; 2Kọ 11:9; 2Te 3:8, 10
1 Tesa. 2:11Ọrụ 20:31
1 Tesa. 2:111Kọ 4:15
1 Tesa. 2:12Efe 4:1; Kọl 1:10; 1Pi 1:15
1 Tesa. 2:12Lu 22:28-30
1 Tesa. 2:121Pi 5:10
1 Tesa. 2:131Te 1:2, 3
1 Tesa. 2:14Ọrụ 17:5
1 Tesa. 2:15Ọrụ 2:22, 23; 7:52
1 Tesa. 2:15Mt 23:34
1 Tesa. 2:16Lu 11:52; Ọrụ 13:49, 50
1 Tesa. 2:16Ro 1:18
1 Tesa. 2:191Te 5:23; 2Te 1:4
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
1 Ndị Tesalonaịka 2:1-20

Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Ndị Tesalonaịka

2 Ụmụnna anyị, unu ma n’eziokwu na ọbịbịa anyị bịara na nke unu efughị ọhịa.+ 2 N’ihi na unu ma na n’agbanyeghị na anyị bu ụzọ taa ahụhụ na Filipaị,+ a kparịakwa anyị, Chineke nyeere anyị aka, anyị akata obi* zie unu ozi ọma Chineke+ n’agbanyeghị na a nọ na-akpagbu anyị nke ukwuu. 3 N’ihi na ndụmọdụ anyị na-enye esighị n’okwu ụgha ma ọ bụ n’echiche ọjọọ ma ọ bụkwanụ n’aghụghọ. 4 Kama anyị na-ekwu ihe ndị a maka na Chineke kpebiri na anyị ruru eru ka e nye anyị ọrụ ikwusa ozi ọma. Anyị anaghị ekwu ihe anyị na-ekwu ka anyị meta ndị mmadụ mma, kama anyị na-ekwu ihe ga-adị Chineke, onye na-enyocha obi anyị,+ mma.

5 N’eziokwu, unu ma na e nweghị mgbe anyị ji ire ụtọ gwa unu okwu. E nweghịkwa mgbe anyaukwu mere ka anyị mewe ka ànyị bụ ihe anyị na-abụghị.+ Chineke bụ onye akaebe anyị. 6 Anyị anọghịkwa na-achọ otuto n’aka ndị mmadụ, ma ọ̀ bụ n’aka unu ma ọ̀ bụ n’aka ndị ọzọ, n’agbanyeghị na anyị nwere ike ịbụrụ unu ibu arọ ma anyị chọọ n’ihi na anyị bụ ndịozi Kraịst.+ 7 Kama, anyị weturu obi ala mgbe anyị na unu nọ, otú nne na-enye nwa ara si ewetu obi elekọta ụmụ ya. 8 N’ihi ya, ebe ọ bụ na anyị hụrụ unu n’anya nke ukwuu, anyị kpebisiri ike* na ihe anyị ga-eme abụghị naanị izi unu ozi ọma Chineke, kama na anyị ga-enye unu onwe* anyị+ maka na anyị hụrụ unu n’anya.+

9 N’eziokwu, ụmụnna anyị, unu na-echeta otú anyị si gbaa ezigbo mbọ ma rụsie ọrụ ike. Anyị na-arụ ọrụ ma n’ehihie ma n’abalị ka anyị ghara ịbụrụ onye ọ bụla n’ime unu ibu arọ+ mgbe anyị na-ezi unu ozi ọma Chineke. 10 Unu bụ ndị akaebe anyị, Chineke bụkwa onye akaebe anyị, na otú anyị si mesoo unu ihe gosiri na anyị kwụsiri ike n’ebe unu nọ, nakwa na anyị bụ ndị ezi omume na ndị a na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta. 11 Unu ma nke ọma na anyị na-adụsi onye ọ bụla n’ime unu ọdụ ike, na-akasikwa unu obi ma na-agbara unu àmà,+ otú nna+ si emere ụmụ ya, 12 ka unu wee na-ebi ndụ otú dị Chineke mma,+ bụ́ onye na-akpọ unu ka unu bata n’Alaeze ya+ nakwa ka unu nweta ebube ya.+

13 N’eziokwu, ọ bụkwa ya mere anyị ji na-ekele Chineke mgbe niile,+ n’ihi na mgbe unu nụrụ okwu Chineke nke anyị gwara unu, unu nabatara ya, ọ bụghị ka okwu ụmụ mmadụ, kama ka okwu Chineke. N’eziokwu, ọ bụ okwu Chineke, ọ na-akpakwa ike n’ime unu ndị kwere ekwe. 14 Ụmụnna anyị, unu na-eṅomi ọgbakọ Chineke ndị dị na Judia bụ́ ndị ha na Kraịst Jizọs dị n’otu, n’ihi na unu tara ahụhụ n’aka ndị obodo unu+ otú hanwa na-atakwa ahụhụ n’aka ndị Juu, 15 bụ́ ndị gbudịrị Onyenwe anyị Jizọs+ na ndị amụma ma kpagbuo anyị.+ Ha anaghịkwa eme ihe dị Chineke mma, kama ha na-eme ihe na-anaghị abara onye ọ bụla uru, 16 n’ihi na ha na-agbalị ka ha gbochie anyị ịgwa ndị mba ọzọ okwu ga-eme ka a zọpụta ha.+ Ha si otú a eme mgbe niile ka mmehie ha dịkwuo ọtụtụ. Ma ọnụma Chineke emechaala bịakwasị ha.+

17 Ma ụmụnna anyị, mgbe e mere ka anyị hapụ unu (n’anụ ahụ́, ọ bụghị n’obi anyị), anyị gbasiri mbọ ike ka anyị hụ unu ihu na ihu maka na ọ gụsiri anyị agụụ ike ịhụ unu. 18 Ọ bụ ya mere anyị ji chọọ ka anyị bịa na nke unu. N’eziokwu, mụnwa bụ́ Pọl gbalịrị ịbịa, ọ bụghị naanị otu ugboro, kama ugboro abụọ. Ma Setan nọchiiri anyị ụzọ. 19 N’ihi na gịnị bụ olileanya anyị ma ọ bụ ọṅụ anyị ma ọ bụ okpueze aṅụrị anyị n’ihu Onyenwe anyị Jizọs n’oge ọnụnọ ya? Ọ̀ bụ na ọ bụghị unu?+ 20 N’eziokwu, ọ bụ unu bụ ebube anyị na ọṅụ anyị.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya