Abụ Mgbago.
126 Mgbe Jehova kpọlatara ndị Zayọn a dọọrọ n’agha,+
Ọ dị anyị ka ọ̀ bụ ná nrọ.
2 Ọchị juru anyị ọnụ n’oge ahụ,
Anyị nọkwa na-eti mkpu ọṅụ.+
N’oge ahụ, mba dị iche iche nọ na-asị:
“Jehova emeerela ha nnukwu ihe.”+
3 Jehova emeerela anyị nnukwu ihe,+
Obi bụkwa anyị sọ aṅụrị.
4 Jehova, biko, kpọlata ndị obodo anyị a dọọrọ n’agha
Otú mmiri ozuzo si asọba n’iyi ndị dị na Negeb.
5 Ndị ji anya mmiri na-agha mkpụrụ
Ga-eji mkpu ọṅụ ghọrọ ihe mkpụrụ ha mepụtara.
6 Onye bu mkpụrụ ọ ga-agha
Bere ákwá na-aga n’ubi
Ga-ebu ọka n’ùkwù n’ùkwù+
Tiri mkpu ọṅụ lọta.+