Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Timoti
3 E kwesịrị ịtụkwasị okwu a obi: Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-agbalị ka o ruo eruo ịbụ onye nlekọta,+ ịrụ ezigbo ọrụ na-agụ ya. 2 Onye nlekọta kwesịrị ịbụ onye ndị mmadụ na-agaghị enwe ihe ha ga-eji kwujọọ ya, di otu nwaanyị, onye na-emeru ihe n’ókè, onye na-ele ihe anya otú dị mma,*+ onye na-eme ihe n’usoro, onye na-ele ọbịa,+ onye ruru eru ịkụzi ihe.+ 3 O kwesịghị ịbụ onye aṅụrụma,+ onye tigbuo zọgbuo,* onye okwu na ụka,+ ma ọ bụ onye hụrụ ego n’anya.+ Kama, o kwesịrị ịbụ onye na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị,+ 4 onye na-elekọta ezinụlọ ya nke ọma, onye ụmụ ya na-akpa àgwà ọma, na-erubekwara ya isi.+ 5 (N’ihi na ọ bụrụ na mmadụ amaghị otú ọ ga-esi na-elekọta ezinụlọ ya, oleezi otú ọ ga-esi na-elekọta ọgbakọ Chineke?) 6 O kwesịghị ịbụ onye chegharịrị ọhụrụ,+ ka ọ ghara ịdị mpako, a maa ya otu ikpe ahụ a mara Ekwensu. 7 O kwesịkwara ịbụ onye ndị na-anọghị n’ọgbakọ na-ekwu okwu ọma gbasara ya,+ ka ndị mmadụ ghara ịkọcha ya,* ya adaba n’ọnyà Ekwensu.
8 Ndị ohu na-eje ozi kwesịkwara ịbụ ndị na-eji ihe akpọrọ ihe. Ha agaghị abụ ndị ire abụọ,* ndị na-aṅụ oké mmanya, ma ọ bụ ndị ji anyaukwu achọ ihe ga-abara naanị ha uru.+ 9 Ha kwesịrị ịbụ ndị akọnuche ha na-anaghị ama ikpe,+ ndị na-ahapụghị ihe nzuzo dị nsọ gbasara okwukwe Ndị Kraịst.
10 E kwesịrị ibu ụzọ nwalee ha iji mara ma hà ruru eru. Ọ bụrụkwa na e nweghị ihe ọ bụla a ga-asị na ha mere,+ ka a họpụta ha ka ha bụrụ ndị ohu na-eje ozi.
11 Ụmụ nwaanyị kwesịkwara ịbụ ndị na-eji ihe akpọrọ ihe, ndị na-emeru ihe n’ókè, na ndị e kwesịrị ịtụkwasị obi n’ihe niile.+ Ha ekwesịghị ịna-ekwutọ ndị mmadụ.+
12 Ohu na-eje ozi kwesịrị ịbụ di otu nwaanyị. O kwesịrị ịna-elekọta ụmụ ya na ezinụlọ ya nke ọma. 13 N’ihi na ndị na-eje ozi nke ọma na-emere onwe ha ezigbo aha, ọnụ na-akakwa ha ikwu gbasara okwukwe ha nwere na Kraịst Jizọs.
14 Agụụ ịhụ gị na-agụsi m ike. Ma, ihe mere m ji na-edetara gị akwụkwọ ozi a bụ a dịghị ama ama mụ egbuo oge tupu mụ abịa hụ gị, 15 ka ị mara otú i kwesịrị isi na-akpa àgwà n’ezinụlọ Chineke,+ nke bụ́ ọgbakọ Chineke dị ndụ. Ọgbakọ a bụ ogidi na ihe na-akwado eziokwu. 16 N’eziokwu, ihe nzuzo dị nsọ, nke dịkwa egwu, gbasara ife Chineke otú ọ chọrọ, bụ: ‘Jizọs bụ mmadụ mgbe ọ bịara n’ụwa.+ A kpọrọ ya onye ezi omume mgbe ọ bụ mmụọ.+ Ndị mmụọ ozi hụrụ ya.+ E zisaara ndị mba ọzọ gbasara ya.+ Ndị mmadụ kweere na ya n’ụwa.+ A kpọgoro ya n’eluigwe, meekwa ka ọ dị ebube.’