1 Timoti
3 Okwu a kwesịrị ntụkwasị obi.+
Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-agbalị ka o ruo eru ịbụ onye nlekọta,+ agụụ ezi ọrụ na-agụ ya. 2 Ya mere, onye nlekọta kwesịrị ịbụ onye a na-apụghị ikwujọ ekwujọ,+ di nke otu nwunye, onye na-emeru ihe n’ókè,+ onye uche ya zuru okè,+ onye na-eme ihe n’usoro,+ onye na-ele ọbịa,+ onye ruru eru izi ihe,+ 3 ọ bụghị onye aṅụrụma nke na-ese okwu,+ ọ bụghị onye na-eti mmadụ ihe,+ kama onye nwere ezi uche,+ ọ bụghị onye nwere mmụọ ịlụ ọgụ,+ ọ bụghị onye hụrụ ego n’anya,+ 4 o kwesịrị ịbụ onye na-elekọta ezinụlọ ya nke ọma,+ onye nwere ụmụ na-edo onwe ha n’okpuru ya, ndị na-eji ihe akpọrọ ihe;+ 5 (n’ezie, ọ bụrụ na onye ọ bụla amaghị otú ọ ga-esi lekọta ezinụlọ nke ya, olee otú ọ ga-esi lekọta ọgbakọ Chineke?) 6 ọ bụghị onye chegharịrị ọhụrụ,+ ka o wee ghara ịbụ onye nganga ga-afụli elu,+ o wee daba n’ikpe a mara Ekwensu.+ 7 O kwesịkwara ịbụ onye ndị nọ n’èzí na-agbara akaebe dị mma,+ ka o wee ghara ịdaba ná nkọcha na n’ọnyà+ Ekwensu.
8 Otú ahụkwa, ndị ohu na-eje ozi+ kwesịrị ịbụ ndị na-eji ihe akpọrọ ihe, ọ bụghị ndị ire abụọ, ọ bụghị ndị na-aṅụ oké mmanya, ọ bụghị ndị na-eji anyaukwu achọ inweta uru aghụghọ,+ 9 onye ji akọ na uche dị ọcha+ jidesie ihe nzuzo dị nsọ+ banyere okwukwe ahụ ike.
10 Ka e bukwa ụzọ nwalee+ ndị a ka a mata ma hà ruru eru, ka ha jeekwa ozi dị ka ndị ozi, ebe ha bụ ndị a na-adịghị ebo ebubo.+
11 Otú ahụkwa, ndị inyom kwesịrị ịbụ ndị na-eji ihe akpọrọ ihe, ọ bụghị ndị nkwutọ,+ ha kwesịrị ịbụ ndị na-emeru ihe n’ókè,+ ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’ihe niile.+
12 Ka ndị ohu na-eje ozi bụrụ di nke otu nwunye,+ ndị na-elekọta ụmụ ha na ezinụlọ ha nke ọma.+ 13 N’ihi na ndị na-eje ozi nke ọma na-emere onwe ha aha ọma,+ ha nwekwara nkwuwa okwu dị ukwuu+ n’okwukwe e nwere n’ime Kraịst Jizọs.
14 Ana m edetara gị ihe ndị a, ọ bụ ezie na m nwere olileanya ịbịakwute gị n’oge na-adịghị anya,+ 15 ma ọ bụrụ na mụ abịaghị ngwa ngwa, ka i wee mara otú i kwesịrị isi na-eme omume n’ezinụlọ nke Chineke,+ nke bụ́ ọgbakọ nke Chineke dị ndụ, ogidi na ihe nkwado+ nke eziokwu. 16 N’eziokwu, ihe nzuzo dị nsọ+ banyere nsọpụrụ Chineke a dị ukwuu: ‘E mere ka ọ pụta ìhè n’anụ ahụ́,+ a kpọrọ ya onye ezi omume ná mmụọ,+ ọ pụtara ìhè n’ihu ndị mmụọ ozi,+ e kwusara ya n’etiti ndị mba ọzọ,+ e kweere na ya n’ụwa,+ a kpọgoro ya n’eluigwe n’ebube.’+