Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Rom
16 Ana m eme ka unu mata Fibi, nwanna anyị nwaanyị, onye na-eje ozi n’ọgbakọ dị na Senkrea,+ 2 ka unu wee nabata ya n’aha Onyenwe anyị otú e kwesịrị isi anabata ndị nsọ* ma nyere ya aka n’ihe ọ bụla o nwere ike ịchọ ka unu nyere ya aka,+ n’ihi na yanwa agbachiterela ọtụtụ ndị, ma mụnwa.
3 Keleerenụ m Priska na Akwịla,+ ndị mụ na ha na-arụ ọrụ Kraịst Jizọs, 4 ndị mere ihe gaara ata isi ha n’ihi m.*+ Ọ bụghị naanị m na-ekele ha, kama ọgbakọ niile dị ná mba dị iche iche na-ekelekwa ha. 5 Keleekwanụ ọgbakọ na-ezukọ n’ụlọ ha.+ Keleenụ onye m hụrụ n’anya bụ́ Epinetọs, onye so ná ndị mbụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Kraịst n’Eshia. 6 Keleenụ Meri, onye rụụrụ unu nnukwu ọrụ. 7 Keleenụ Andrọnaịkọs na Junias, bụ́ ndị ikwu m+ a tụrụ mụ na ha mkpọrọ, ndị ndịozi ma nke ọma, ndị bu m ụzọ sowe ụzọ Kraịst.
8 Keleerenụ m Amplietọs, onye m hụrụ n’anya na-eso ụzọ Onyenwe anyị. 9 Keleenụ Ọbenọs, onye anyị na ya na-arụrụ Kraịst ọrụ, nakwa Stekis onye m hụrụ n’anya. 10 Keleenụ Apelis, onye omume ya dị Kraịst mma. Keleenụ ndị si n’ezinụlọ Arịstọbulọs. 11 Keleenụ Herodiọn onye ikwu m. Keleenụ ndị si n’ezinụlọ Nasisọs, ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị. 12 Keleenụ Traịfina na Traịfosa, bụ́ ụmụ nwaanyị na-arụsi ọrụ Onyenwe anyị ike. Keleenụ Pesis, nwanna nwaanyị anyị hụrụ n’anya, n’ihi na ọ rụsiiri Onyenwe anyị ọrụ ike. 13 Keleenụ Rufọs, onye pụrụ iche na-ejere Onyenwe anyị ozi. Keleekwanụ nne ya, onye bụ́kwa nne m. 14 Keleenụ Asịnkritọs, Fligọn, Hemis, Patrọbas, Hemas, na ụmụnna ha na ha nọ. 15 Keleenụ Filọlọgọs na Julia, Niriọs na nwanne ya nwaanyị, na Olimpas, nakwa ndị nsọ niile ha na ha nọ. 16 Susuonụ ibe unu ọnụ mgbe unu na-ekele ibe unu.* Ọgbakọ niile nke Kraịst na-ekele unu.
17 Ụmụnna m, m na-agba unu ume ka unu kpachara anya maka ndị na-akpata nkewa ma na-eme ihe ndị nwere ike ime ka unu zọhie ụkwụ. Ihe ndị a ha na-eme dị iche n’ihe a kụziiri unu. Zerekwanụ ndị ahụ.+ 18 N’ihi na ụdị ndị ahụ anaghị agbara Onyenwe anyị Kraịst ohu, kama ọ bụ ihe na-agụ ahụ́ ha agụụ* ka ha na-agbara ohu. Ha na-ekwukwa okwu na-atọ ụtọ ma na-aja ndị mmadụ mma na-esighị ha n’obi ka ha rafuo ndị na-ebughị ihe ọjọọ n’obi. 19 Mmadụ niile amarala na unu na-erube isi. N’ihi ya, ihe unu na-eme na-eme m obi ụtọ. Ma achọrọ m ka unu bụrụ ndị ma ihe ma a bịa n’ihe dị mma, ma bụrụ ndị aka ha dị ọcha ma a bịa n’ihe ọjọọ.+ 20 Chineke, onye na-eme ka anyị nwee udo, ga-azọpịa Setan+ n’okpuru ụkwụ unu n’oge na-adịghị anya. Ka Onyenwe anyị Jizọs meere unu amara.
21 Timoti onye ọrụ ibe m na-ekele unu. Lushiọs, Jesin, na Sosipata, bụ́ ndị ikwu m,+ na-ekelekwa unu.
22 Mụnwa bụ́ Teshiọs, onye deere Pọl akwụkwọ ozi a, na-ekele unu n’aha Onyenwe anyị.
23 Gayọs,+ onye m nọ n’ụlọ ya, onye ọgbakọ a niile na-ezukọkwa n’ụlọ ya, na-ekele unu. Erastọs, onye na-ahụ maka ego obodo,* na-ekele unu. Kwọtọs nwanne ya nwoke na-ekelekwa unu. 24* ——
25 Ozi ọma m na-ezisa na ozi m na-ekwusa banyere Jizọs Kraịst gosiri na Chineke ga-emeli ka unu guzosie ike. Ozi ọma a dabara n’ihe dị nsọ e kpughere nke e zoro ezo+ kemgbe oge dị anya. 26 Ma, e meela ka a mata* ya ugbu a. E jirikwala amụma ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ mee ka mba niile mata ya. Ihe a dabara n’iwu Chineke onye na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi nyere ka mba niile wee nwee okwukwe na ya ma na-erubere ya isi. 27 Ka e si n’aka Jizọs Kraịst nye Chineke, onye naanị ya ma ihe,+ otuto ruo mgbe ebighị ebi. Amen.